Posts

Showing posts with the label Ndi Igwe

E nyela ndị igwe ọhụrụ asambodo n'Anambra

DỊKA a sị na ọ na-adị mma a kpụọ Diji, a kpụnye ya óké ji n’aka, gọọmenti steeti Anambra enyela ụfọdụ ndị eze ọdịnala ọhụụ na steeti ahụ akwụkwọ ikike idu obodo ha dị ich-iche. Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị ukwu ndị ukwu e ji okwu ha agba ìzù n’ihe gbasaara echichi na steeti ahụ, nke gụnyere eze ọdịnala Ọnịtsha, bụ Igwe Nnaemeka Achebe; ògbò ya nke obodo Mbaukwu, bụ Igwe Peter Anugwu; nke obodo Nteje, bụ Igwe Roland Odegbo; eze ọdịnala Ọkpụnọ, bụ Igwe Sunday Okafor; nke Akwaihedị, bụ Igwe J.A.C Onebụnne, tinyere nke obodo Isseke, bụ Igwe Emmanuel Nnabuife. Ndị ọzọ gụnyèrè ndị omebe iwu na ndị ọzọ selitere isi n’ọrụ gọọmenti, ndị ndu òtù Ọhaneze Ndị Igbo, na ndị isi ọchịchị obodo. N’okwu ya ọ na-enye ha akwụkwọ ikike ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Obianọ chetaara ndị eze ọdịnala ahụ na ọchịchị bụ maka nchịkwa obodo na mmadụ, dịka o siri bụrụ mmasị Chineke, ma kpọkùzie ha ka ha wère òhèrè ọchịchị ahụ wee hazi

Obianọ enyela ndị igwe ọhụrụ akwụkwọ ikịke

DỊKA a sị na ọ na-adị mma a kpụọ Diji, a kpụnye ya óké ji n’aka, aka na achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ enyela Igwe Ihiala, Igwe Thomas Obidiegwu, Oluoha nke asatọ  n’Ihiala  na  Igwe Raphael Chukwurah nke  Ụmụdiọka dị n’okpuru ọchịchị Dunukọfịa na steeti ahụ asambodo dịka eze ọdịnala obodo ha. Mmemme inye asambodo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị eze ọdịnala na ndị e ji okwu ha agba ìzù n’ihe gbasaara ọchịchị na echichi ọdịnala. Dịka ọ na-enye ha àsàmbodo ahụ, Gọvanọ Obianọ chetaara ndi eze ọdịnala ahụ na ọchịchị bụ maka nchịkwa obodo na mmadụ, dịka o siri bụrụ mmasị Chineke, ma kpọkùzie ha ka h wère òhèrè ọchịchị ahụ wee hazie ma chịkwaa  obodo na ndị bi n’ime ya n’ụzọ ọma dịka a tụrụ anya. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha ghara ịbụ eze na-agbakụta ndị ha na-achị azụ, ma gbakwa mbọ hụ na ha tinyèrè úchú n’ebe ndị ntorobịa obodo ha nọ, iji mee ka ha bụrụ ndị bara úrù, ma sikwazie n’ụzọ dị otu ahụ wee kwàlite udo na ọnọdụ mmepe

E nyela Igwe ọhụrụ abụọ akwụkwọ ikike n'Anambra

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ enyela igwe abụọ a họpụtara ọhụụ asambodo na steeti ahụ iji wee malite ọlụ ozigbo dịka eze ọdịnala obodo ha dị iche iche. Mmemme inye asambodo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị e ji okwu ha àgbá ìzù na steeti, ndị obodo eze ọdịnala abụọ ahụ, nke dịgbàdò n’okpuru ọchịchị Ọgbaru, tinyere ndị enyi na ndị na-echere ha ezi echiche. N’okwu ya dịka ọ na-enye ha àsàmbódò ahụ, Gọvanọ Obianọ tụụrụ ndị eze ọdịnala abụọ ahụ mmamma, bụ Igwe Fidelis Nsọfọr nke obodo Ụmụnankwọ na Igwe Lawrence Ọgụgụọ nke obodo Akịlị ọzịzọ, maka ịbụ ndị a hụtara dịka ndị tozùrú òkè idu obodo abụọ ahụ, ma kọwaa nhọpụta ahụ dịka nke a tụrụ anya na ọ ga-ewèta udo tọrọ àtọ n’ime obodo ha. Ọ kọwaara ha bụ ndị eze ọdịnala mkpa ọ dị ịdị na-atụpụta atụmatụ dị iche iche maka ịkwàdò na ịkwàlìtè ndị ntorobịa n’obodo ha iji wee nyere ọchịchị steeti ahụ aka n’ezi mbọ ahụ ọ na-agba ugbu a iji hụ na onye ntorobịa ọbụla na steeti