Aka EFCC akparala ndị China abụọ maka inye aka azụ
ỤLỌỌRỤ ahụ na-ebu agha megide mpụ na arụrụ ala n’alaNigeria, a maara dịka ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission’ (bụEFCC n’aha ịchafụ bekee) anwụchiela mmadụ abụọ bụ ụmụafọ mbà China maka inyeonye ọrụ ha aka azụ na steeti Sokoto. Nke a bụ nke e kwupụtarasite n’ọnụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi n’ụlọọrụ EFCC na mpaghara Sokoto, bụMaazị Dele Oyewale, site n’ozi ọ kụpụrụ na nso nso a, iji mee ka ụwa mara nkeahụ. Dịka o siri kọwaa,mmadụ abụọ ndị China ahụ, bụ Maazị Meng Wei Kun na Maazị Xu Koi nyèrè onyeisi ụlọọrụahụ na mpaghara Sokoto, bụ Maazị Abdullahi Lawal ọkpụrụkpụ ego dị otu narị ndenaịra iri ise (100, 000,000) dịka aka azụ. Aka azụ ahụ ka ekwuru na ebumnobi ndị ahụ jiri nye ya bụ iji pịchie maọbụ mee ka ya bụ onyeisi ụlọọrụEFCC kpùdo eziokwu ihu n’ala na nnyocha dị omimi a na-enyocha otu ụlọọrụ ngomba China, a maara dịka ‘China Zhonghao Nig. Ltd’ bànyere ọrụ ngo gọọmentisteeti Zamfara nyere ụlọọrụ ahụ n’agbàtà ahọ 2012 ruo 2019. Ọrụ ngo ahụ bụ nkegburu ego dị ijeri n