Posts

Showing posts with the label Ndakpo

Na Delta, otu nwoke amaala ụmụnne nwaanyi abụọ na-eto eto elu n’ike

OTU NWOKE gbara afọ iri atọ na ise aha ya bu Jude Nduka amaala ụmụnwaanyi abụọ bụ nwanne na nwanne ka na-eto eto elu n’ike. Ya bụ ihe mere n’Asaba isi obodo Delta. Dika nne ụmụaka abụọ ahụ si nye mkpesa n’ogige ndị uweojii, ka nwoke ahụ machara ha elu n’ike, nwata nwaanyi nke gbara afọ iri na isii dị ime  ebe nke dị afọ iri na atọ nwetara mmerụ ahụ. Onyeuweoji na-ahu maka ọdị mma ha na ndị mmadụ na steeti ahụ, DSP Bright Edafe onye kwuputara na ya bụ ihe mere n’eziokwu kwuru na a nwụchikọọla nwoke ahụ kpara arụ. O kwukwara na dịka a na-agba ya ajụjụ, na nwoke ahụ kwetere na ya kpara arụ ahụ n’ezie. Edafe gara n’ihu kwuo: “E meela ha abụọ nnyocha ahụike ma nwụchikọọ onye ahụ kpara arụ dịka a ga-akpụpụ ya ụlọịkpe ma e mechaa nnyocha banyere otu ihe siri me”

Gọọmenti kwesịrị inye nwoke dakporo nwaanyị n'ike ntaramahụhụ dị egwu

Ịdakpo ụmụnwaanyị ma kwaa ha iko n’ike bụzi okwu a kpụ n’ọnụ n’ụwa niile gbaa gburugburu ugbu a. Ọ bụghị sọ na a na-eme nke a, ụfọdụ n’ime ha ka a na-egbu egbu. Nke a bụ nnọọ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n’isi. Gọọmenti mba dị iche iche na-agba mbọ n’elu na ala iji hụ na e gbochiri ya bụ ajọ ọnọdụ mana a na-ekwu ndị mere eme, a na-eme ya na-agawanye n’ihu. Dịka ndị mmadụ na-eti mkpu ma na-akatọ arụrụala a, onye nta akụkọ anyị CHINWENDU UZOATU gbara ọtụtụ ajụjụ ọnụ banyere ya: REV Adaobi – Nke a bụ njirimara ọgwụgwụ oge. Ndị mmadụ enwezighị egwu Chineke nke ha na-asọpụrụ njirimara ha. Ụmụ ụwa na-ańụ ọgwụ ike aghara aghara ma na-abakwa otu nzuzo dị iche iche nke na-etinye ha n’ime ihe ala na-asọ nsọ. Ihe ọzọ bụ na ụzọ e si a zụlite ụmụaka dị nnukwu mkpa.   Ekwesịghị inye ụmụaka ohere ka ha na-eme ihe sọrọ ha.Umụaka na-elelezi ihe ọjọọ dị iche iche n’onyoonyoo dịka ndị gba ọtọ.Ha jizi ekwentị eme ihe dị ha mma. Egwu dị. N’oge  mbụ, ọbụghị sọ nne na nna na-azụ nwa makana nwa b

Nwoke dinara nwa ya sị na nwunye ya amaghịzị mma n'anya ya

AKA abụọ aghọọla Maazị Ubong Akpan otu aka, ka ndị uweojii nwetechara mkpesa banyere etu o si edina ma na-amazụrị nwa ya nwaanyị n’ezinụlọ be ya, n’enweghị onye ọbụla ma ihe na-aga.   DSP Abimbola Oyeyemi, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Ogun mere ka ụwa mara nke a, ma kọwaa na a nwụchikọrọ ya bụ nwoke site n’aka ngalaba ọrụ uweojii dị na mpaghara Itele Ota oge ha nwetachara mkpesa site n’aka nwa ya nwaanyị banyere ihe ọ na-eme.   Dịka o siri kọwaa, nwata nwaanyị ahụ gbara naanị ahọ iri na abụọ (12yrs) wètààrà ha mkpesa na nna ya ahụ bụ Ubong Akpan (gbárá ahọ iri anọ na iteghete) malitere iri ya ọkọmbọ (ịkwaso ya iko) oge ọ dị naanị ahọ asaa, ma sịkwa ya ekwekwala ka mmadụ ọbụla mara ihe na-aga, maọbụkwanụ gwakwa onye ọbụla banyere nke ahụ.   Ya bụ nwata nwaanyị dị ahọ iri na abụọ ugbua kwukwara na nna ya ahụ apịala ya ọkụ ahụ ọtụtụ oge, ruo ahọ ise zuru èzù, nke na o nweghịzị ike idìnwù ya maọbụ ịgbachị nkịtị, bụzị nke mere o jiri sị ka ọ bịa kpesara ndị

N'Anambra, e jidela mmadụ abụọ maka ịkwaso nwata ahọ iri na isii iko n'ike

Ọ NA-ADỊ mma onye rụkata ala, ala arụba ya, maka na ọ na-abụ ikuku kuo, a hụ ike ọkụkọ.   Ka ọ dị taa, aka ndị uweojii n’ime steeti Anambra akpàrala mmadụ abụọ maka ịdakpò na ịkwasò otu nwata nwaanyị gbara naanị ahọ iri na isii iko n’ike.   Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze nà ndị uweojii n’ime steeti Anambra, bụ CSP Haruna Mohammed bụ ya kwupụtara nke site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ.   Dịka o siri kọwaa, ọ dị nchèta na ndị a maghị ndị ha bụ nọrọ n’abalị iri na iteghete nke ọnwa Febụwarị wee jikọta onwe ha ọnụ wee dakpò otu nwata gbara ahọ iri na isii na mpaghara ụzọ Osumowo dị n’Awada, n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra, ma kwaso ya iko n’ike, hapụ ya n’ogbu ọbara, nke na ọ machaghịzịkwa onwe ya; ha wee gbafuo.   E buru nwata nwaanyị ahụ wee gaa ụlọọgwụ, ebe a nọrọ wee lelee ya ahụ wee chọpụta n’ezie na e riri ya ọkọmbọ ọtụtụ ugboro. A malitekwazịrị inye ya ọgwụgwọ n’ebe ahụ.   Ka ndị uweojii steeti Anambra nwetara ya bụ mkpesa banyere arụrụala ahụ na-asọ ntị oyi, h

Na Delta, aka akparala pastọ maka ịma nwaanyị ụka ya elu n'ike n'ogige ụlọụka

NDỊ uweojii steeti Delta anwụchịkọọla ma kpụgharịa otu pastọ aha ya bụ Frank Osedi nke ụlọụka Sure Fire Ministry, Kwale n’okpuru ọchịchị Ndokwa East na steeti ahụ maka ịdakpo ma kwaa otu nwaanyị onye ụka ya gbara afọ iri abụọ iko n’ike n’ogige ụlọụka ahụ.   Kọmadị uweojii ahụ kwuputara na pastọ ahụ kpọrọ nwaanyị ahụ ka ọ bịa n’ụlọụka ahụ n’ụzọ aghụghọ na ọ bụ maka ekpere ka ọ na-akpọrọ ya.   Ọ bụ eziokwu na nwaanyị ahụ kpọrọ nwanne ya nwoke gaa ịza oku ahụ n’ụlọụka, mana dịka e siri kọwa, pastọ ahụ kpọrọ ya gaa n’otu ụlọ arụchaghị arụcha dị n’ogige ụlọụka ahụ, ebe ọ kpọchịrị ụzọ ma kwaa ya iko n’ike.   Ndị uweojii gbara ama na pastọ ahụ sụrụ mma n’ala ma kwuo na ọ ga-egbu ya ma o mee ka onye ọbụla matai he ahụ merenụ.   N’akụkụ nke ya, Pastor Frank Osedi kwuru sị: ‘Akpọrọ m ya gaa n’ụlọ arụchabeghị arucha ahụ maka ikpere ya ekpere. Mpaghara ụlọ ahụ aruchabeghị arụcha bụ ebe e doro nsọ n’ogige ụlọụka ahụ.”

Ndị uweojii Anambra ejidela nwoke kwasòrò nwata afọ asaa iko n'iké

OTU nwoke gbara ahọ iri abụọ na iteghete nọ n’aka ndị uweojii steeti Anambra ugbua ma bụrụkwa onye aka abụọ ghọrọ otu aka, maka ịdakpò otu nwatakịrị nwaanyị gbara afọ asaa, ma rie ya ọkọmbọ n’iké. Ya bụ nwoke ka e kwuru na aha ya bụ Ogbu Christian, ma bụrụkwa onye obodo Mboshi dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Igboeze North’ nke steeti Enugu ma biri na mpaghara okporo ụzọ Aniche dị n’Okpoko, na steeti Anambra. Dịka Maazị Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Anambra siri kọwaa n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ banyéreụé nke ahụ, ya bụ nwoke bụ onye e jidere n’abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọkụtooba a. Akụkọ kọrọ na ya bụ nwoke nọrọ na nsonso a wee jiri achịcha ekoghị eko bụ biskiiti wee ràtá nwa onye agbatobi ya (bụ nwatakịrị nwaanyị onye agbatobi ya gbara naanị ahọ asaa), dubàá ya n’ime ụlọ ya, ma nọrọ ebe ahụ mazụrịa ya – kwasò ya iko n’iké. Ndị uweojii nwụchikọzịrị ya bụ mkpi na-agbara ọha ewu oge ha nwètàrà mkpesa bànyere ihe o mere. N’imé nnyòcha, ha gakwara n’ebe ahụ ya

Ndakpò: Otu ụmụnwaanyị emeela ngagharị iwe n'Awka

N’IJI tụnye ụtụ nke ha n’ịkatọ na ibu agha megide arụrụalaahụ na-achọzị ịghọ omenala, òtù a maara dịka ‘Okpotokpo Adaigbo’ nọrọ nanso-nso a wee mee ngagharị iwe n’ụzọ udo megide nkwasò iko n’ike, bụ nkena-ewùzị na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria ugbu a.   Ya bụ ngagharị iwe bụnke weere ọnọdụ na steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ha mèèrè gaa n’ụfọdụ isi ụlọọrụdị iche iche dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, nke gụnyere ogige isi ụlọọrụ ndịuweojii steeti Anambra, bụ ebe ha nọrọ wee kpọtụrụ onyeisi uweojii steeti ahụ.   N’okwu ya banyerenke ahụ, onye duru ndị ahụ wee bịa ya bụ ijè, ma bụrụkwa onyeisi òtù OkpotokpoAdaigbo n’ụwa gbaa gburugburu, bụ Oriakụ Ogochukwu Okparasili kọwàra na òtù ahụbụ òtù nnọrọonwe jikọtara ụmụnwaanyị n’ala Igbo.   Ọ kwuru na ihe mereha jiri bàgide na ngagharị iwe ahụ bụ iji gosipụta obi mwute ha bànyere etu akụkọndakpò na ịkwaso iko n’ike sizị arị ibe ya elu ugbu a ma bụrụkwazie nke a na-anụzịkwà ụbọchị na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria.   O kọwara

A tụọla ọkwọụgbọala dakporo nwaanyị bunye ya ọrịa ịba ọchananya nga mkpụrụ ọka

NNUKWU ụlọikpe steeti Ondo nke dị n’Akure atụọla onye ọkwọụgbọalaaha ya bụ Blessing Kingsley nga mkpụrụ ọka maka ịma nwata nwaanyị gbara afọ irina anọ elu n’ike ma bunyekwa ya ọrịa ịbaọchananya (hepatitis B).   Ikpe ahụ nke JusticeBode Adegbehinge nọ n’isi ya kpebiri na ikpe mara Kingsley na ya bụ okwu nke ewetara afọ abụọ gara aga.   Kingsely ka e kwuruna ọ kwara nwata nwaanyị ahụ iko n’ike n’afọ 2018 ka o si n’ọdụahịa (shop) nnennukwu (grandmother) ya dị na Ondo alọta. Ụlọikpe ahụ chọpụtara na o buuru nwaahụ n’ụgbọala ya gaa n’ụlọ ya n’ụdị na ọ chọrọ ka o kelee ndị be ya wee si n’ụzọahụ dakpoo ya n’ike.   Justice Adegbeghengedịka ọ na-ebe ikpe kwuru sị: “E nyere mkpesa ozugbo n’ogige ndịuweojii nkeFunmbi Fagun, ebe nnyocha ahụike e mere gosiri na a kwara ya iko n’ike mabunyekwa ya  ọrịa ọchananya (B).   Kingsley akpọtaghịonye aka ebe ọzọ karịa onwe ya, ebe ndị nke nwata nwaanyị ahụ kpọtara ndịakaebe anọ nke gụnyere onye ahụ a dakporo, onye uweojii nwụchikọrọ Kingsley bụOlanrewaju Agb

Arọrọ m nrọ na ọ bụrụ na m dakpoo nwata nwaanyị n'ike, a ga m abụ ọgaranya

… Nwoke dakporo nwata nwaanyị n’ike OTU nwoke aha ya bụ Aliyu Adamu gbara afọ iri anọ na abụọekwuputala na ihe ya ji dakpo nwata nwaanyị ma kwaa ya iko n’ike bụ n’ihi na yarọrọ nrọ na ya mee otu ahụ na ya ga-abụ ọgaranya.   O kwuputara nke ahụdịka kọmandị ndị uweojii steeti Nasarawa nwụchikọrọ ma kpụgharịa ya na Lafia.   Ya bụ nwoke kwuru sị:“Abụ m onye Bukan Ari n’okpuru ọchịchị Lafia. Arọrọ m nrọ na ọ bụrụ na m dakpooma kwaa nwata nwaanyị dị n’agbata afọ ise na afọ iri iko n’ike, aga m abụ ọgaranya.Ọ bụ ya kpatara m jiri mee ihe m rọrọ na nrọ.”   Kọmishọna ndịuweojiina steeti ahụ, Maazi Longe, kwuru sị na a nwụchikọrọ nwoke ahụ maka ịdakponwata nwaanyị gbara afọ asatọ. Kọmishọna ahụ kọwara na ndị na-ahụ maka arụ nasteeti ahụ, State Criminal Investigation Department (SCID) na-enyochazi okwu ahụugbu a.   Kọmishọna kpụgharịrịnwoke ahụ na mmadụ iri anọ na anọ ndị ọzọ bụ ndị kpara arụ dị iche iche.   N’otu aka ahụ ndịuweojiisteeti ahụ nwụchikọkwara otu nwoke gbara afọ iri abụọ na abụọ aha

Egwu dị dịka ụmụnwoke na-adakpozi ụmụnwaanyị na-anyụ nsị n'ime ọhịa

A NA-AKPỌRỊRỊ oku ka ndị mmadụ kwụsị ịnyụ nsị n’ọhịa. Dịkaewu na ọkụkụ maara na a na-esi n’ụzọ dị otu ahụ na-ekesa ọrịa, nchọpụtana-egosikwa ugbu a na ụmụnwoke na-awakpozi ụmụnwaanyị ma ha gaa ịnyụ nsị n’ime ọhịa.   Ime ọhịa na-ada owu,ya mere ụmụnwoke ndị ọnọ nkịtị enweghị efe na-eke nwkụcha wee chebiri ụmụnwaanyịndị gụnyere ụmụaka na ndị okenye batara na ya ka ha nyụọ nsị.   Na nsonso a, naRukuba nke dị n’okpuru ọchichị Jos North na steeti Plateau, a dakporo ma kwaaotu nwata nwaanyị ka na-eto eto na-ara ọrịa (sickle cell) iko n’ike dịka ọ garaịnyụ nsị n’ọhịa.   O kwuru sị na mgbenwoke ahụ bụ onye nọ n’ọsọ ugbu a hụrụ ya: “O butere nnukwu okwute, jide mn’olu m ma ńụọ iyi na ọ ga-akụri m isi ma ọ bụrụ na m tie mkpu. Oke egwu ji mnke na etighi m mkpu; ya mere mgbe ọ dakpochara m ejisiri m ike laa n’ụlọ gwandị ezinaụlọ m ihe merenụ.”   Nwaanyị ọzọnwaokorobịa dakporo ka ọ na-aga ahịa ma baa ịnyụ nsị n’ọhịa kwuru sị: “Enweghịm ụlọ mkposi n’ụlọ m, ana m anyụ nsị n’ọhịa ma m na-aga ahịa. Ezu

E kwesịrị inye nwoke dakporo nwaanyị n'ike ntaramahụhụ dị egwu

Ị dakpo ụmụnwaanyị ma kwaa ha iko n’ike bụzi okwu a kpụ n’ọnụ n’ụwa niile gbaa gburugburu ugbu a. Ọ bụghị sọ na a na-eme nke a, ụfọdụ n’ime ha ka a na-egbu egbu. Nke a bụ nnọọ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n’isi. Gọọmenti mba dị iche iche na-agba mbọ n’elu na ala iji hụ na e gbochiri ya bụ ajọ ọnọdụ mana a na-ekwu ndị mere eme, a na-eme ya na-agawanye n’ihu. Dịka ndị mmadụ na-eti mkpu ma na-akatọ arụrụala a, onye nta akụkọ anyị CHINWENDU UZOATU gbara ọtụtụ ajụjụ ọnụ banyere ya: REV Adaobi – Nkea bụ njirimara ọgwụgwụ oge. Ndị mmadụ enwezighị egwu Chineke nke ha na-asọpụrụnjirimara ha. Ụmụ ụwa na-ańụ ọgwụ ike aghara aghara ma na-abakwa otu nzuzo dịiche iche nke na-etinye ha n’ime ihe ala na-asọ nsọ. Ihe ọzọ bụ na ụzọ e si a zụliteụmụaka dị nnukwu mkpa.   Ekwesịghị inye ụmụaka ohere ka ha na-eme ihe sọrọ ha.Umụaka na-elelezi ihe ọjọọ dị iche iche n’onyoonyoo dịka ndị gba ọtọ.Ha jizi ekwentị eme ihe dị ha mma. Egwu dị. N’oge  mbụ, ọbụghị sọ nne na nna na-azụ nwa makana nwa bụ