Na Delta, otu nwoke amaala ụmụnne nwaanyi abụọ na-eto eto elu n’ike
OTU NWOKE gbara afọ iri atọ na ise aha ya bu Jude Nduka amaala ụmụnwaanyi abụọ bụ nwanne na nwanne ka na-eto eto elu n’ike. Ya bụ ihe mere n’Asaba isi obodo Delta. Dika nne ụmụaka abụọ ahụ si nye mkpesa n’ogige ndị uweojii, ka nwoke ahụ machara ha elu n’ike, nwata nwaanyi nke gbara afọ iri na isii dị ime ebe nke dị afọ iri na atọ nwetara mmerụ ahụ. Onyeuweoji na-ahu maka ọdị mma ha na ndị mmadụ na steeti ahụ, DSP Bright Edafe onye kwuputara na ya bụ ihe mere n’eziokwu kwuru na a nwụchikọọla nwoke ahụ kpara arụ. O kwukwara na dịka a na-agba ya ajụjụ, na nwoke ahụ kwetere na ya kpara arụ ahụ n’ezie. Edafe gara n’ihu kwuo: “E meela ha abụọ nnyocha ahụike ma nwụchikọọ onye ahụ kpara arụ dịka a ga-akpụpụ ya ụlọịkpe ma e mechaa nnyocha banyere otu ihe siri me”