N'Akure, a mala natọ ikpe ọnwụ maka ịtọrọ ndị sista
ỤLỌIKPE ukwu, Akure High Court dị na steeti Ondo amala mmadụ atọ ikpe ọnwụ maka ịtọrọ ndị sista (Rev Sisters) atọ ma narakwa otu nde naịra maka ịtọhapụ ha, n’afọ 2016. A mara ndị omekome ahụ ikpe ọnwụ n’ihi na ikpe mara ha dịka ha tọọrọ ndị sista ahụ n’Onipetesi nke dị n’ụzọawaraawara Ore-Sagamu ma jide ha abalị iri na otu n’ime ọhịa ka ha narachaara akatamkpo ego. Onye ọrụ nchekwa DSS onye gbara ama oge a na-ekpe ikpe ahụ, Johnson Siunu kwuru na a wakporo ndịntọrị ahụ ma nwụchikọọ ha site n’akara ekwentị ha ji kpọọ oku maka ihe banyere ụgwọ a kwụrụ ha. Mmadụ asaa ka a nwụchikọrọ maka arụ ahụ ndị gụnyere di na nwunye. Otu onye n’ime ha bụ Saheed Oyewo nwụrụ n’ụlọnga ebe a dara nwunye otu onye n’ime ha bụ Reuben e kwuru na aka ya dị n’arụ ahụ nha. N’ikpe ya, Justice Ademola Adegoroye kwuru na o nweghị ihe a hụtara n’ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ, nke mere na ọ hapụrụ ha ka ha laa. Ya mere ọ mara mmadụ atọ n’ime ha ikpe ọnwụ. Ndị ahụ bụ: Reuben Akinbehinje, Uche onye e ji Uchenna