Posts

Showing posts with the label Ndị uweojii

Ndị uweojii ejidela nwoke zuru ego ndị ụka

ỤKWỤ na-aga warawara, anya na-aga warawara na-ahụ ya.   O wee bụrụ otu ahụ ka ndị uweojii n’ime steeti Ekiti siri nwụchikọọ otu nwoke gbara afọ iri ato na atọ maka izu ego  onyinye n’otu ụlọụka ma buru ya larie.   Nwoke ahụ, bụ Maazị Akindele Olufemi, ka e kwuru na o zuru ego ruru narị puku naịra isii na iri abụọ na uma otu narị naịra na iri na ise (N620,115) n’otu ụlọụka a maara dịka ‘Christ Apostolic Church’s Campground’ dị na mpaghara Ikeji Arakeji nke steeti Osun ma bụrụzie ya na-ala na steeti Ekiti, tupu aka ndị uweojii wee kpàrá ya na mpaghara Igbara Odo Ekiti.   Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti Ekiti bụ DSP Sunday Abutu Siri kọwaa, ọ bụ oge ndị uweojii nọ n’ogologo ụzọ awara-awara Igbara-Odo-Akure na-akwụsị ma na-enyocha ụgbọala na ndị nọ n’ime ya ka ha hụrụ Olufemi ka o kò àkpà ụmụakwụkwọ n’azụ, nke mezịrị ka ha kpọ̀ghee ya iji mara ihe dị n’ime ya.   Kaosiladị, ọ sị na mgbe ndị uweojii kpọ̀ghere akpa ahụ, na ha hụrụ ụdị ego dị icheiche n’ime

Ndị uweojii ejidela nwoke bu égbè ntụ aga nzukọ ndị otu nzuzo

NDỊ uweojii steeti Anambra, na ndị òtù ọrụ nchekwa anwụchiela otu nwoke dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Izunna Ifeobu, onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye otu nzuzo.   Dịka ozi a kụpụ̀rụ̀ site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu si kọwaa, onye ahụ a na-enyo enyo bụ̀ nwaafọ obodo Ugamuma dị n’Obosi, ma bụrụ onye e nwètèrè otu ogologo egbe ntụ e bèrè èbè n’aka ya, na mpaghara Eke Obosi, n’akụkụ okporoụzọ ahụ siri Obosi gaa Nkpor.   O kwùrù na oge a gbara ya bụ nwoke ajụjụọnụ, na o jìrì ọnụ ya na kwupụta na ya bụ onye otu nzuzo ‘Baggers’, ma kwukwa na ọ na-aga nzukọ ebe a ga-anọ mee mmemme idu ya n’iyi ọrụ, tupu e wee jide ya, ma napụ̀takwa ya égbè ntụ ahụ o kechiri n’akpà.   Ikenga gara n’ihu kwuo na ndị otu ahụ ndị ọzọ, mgbe ha nụrụ gbasara njide ahụ e jidere Ifeobu, gbapụrụ n’ebe ahụ ha na-enwe nzukọ, wee rie mbọmbọ ọsọ, nke mezịrị na a hụghị maọbụ jide ha oge a garuru ebe ahụ.   O kwuru na e nyefeela okwu ahụ n’aka ngalaba

N'Ekiti, ndị uweojii ejidela ụmụnne abụọ bụ ndị ntọ

KỌMISHỌNA uweojii na steeti Ekiti, Moronkeji Adesina ekwuputala na ndị uweojii anwụchikọọla mmadụ atọ bụ ndị ntọ̀ na steeti ahụ.   Dịka o siri kwuo, ndị ahụ a nwụchikọrọ bụ Abdullahi Musa gbara ahọ iri atọ na asatọ, Abdullahi Ali, ahọ iri abụọ na ise, na Abdullahi Suleiman dị ahọ iri na iteghete.  Ali na Suleiman ka e kwuru na ọ bụ otu nne na nna mụrụ ha, ebe Musa nke kacha okenye na ndị ntọ ahụ si n’afọ nne na nna ọzọ.   Kọmishọna uweojii ahụ kwuru na a nwụchikọrọ ndị ntọ̀ ahụ n’ime otu nnukwu ọhịa dị n’Ijan-Ekiti n’okpuruọchịchị Gbonyin na steeti ahụ. Ọ kọwara na ọ bụ site na njikọ aka nke ndị Rapid Response Squad (RRS) na ndị ọrụ nchekwa ogbe, ka e jiri nwụchikọ ha.   Adesina, n’ozi nke sitere n’aka okwuputa okwu ndị uweojii na steeti ahụ, DSP Abutu Sunday n’Ado-Ekiti, kwuru na ndị ntọ ahụ ji ọnụ ha kwuputa, ka a na-ajụ ha ajụjụ na ha atọọl ọtụtụ mmadụ na steeti ahụ. Ọ sị: “Dịka otu n’ime mbọ ụlọọrụ uweojii steeti a na-agba iji kpochapụ ndị ntọ na ndị omekome ndị ọzọ na steeti a, Ra

Na Niger, e kesàárala ezinụlọ ndị uweojii nwụrụ anwụ ego nkwàdó

Image
ONYEISI ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Monday Bala Kuryas nọrọ na nsonso a wee kesàárá ụfọdụ ndị mmadụ, bụ ndị ezinụlọ ndị ọrụ uweojii nwụrụ n’ọrụ uweojii n’ime steeti ahụ akwụkwọ ndọrọ ego nkwàdo mgbàkọta ya ruru nde naịra iri isii na anọ na ụma narị puku naịra asaa (₦64,700,000).   Ego ahụ bụ nke CP Echeng kesàrà nye ndị ahụ n’aha onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Akali Baba Usman, ma bụrụkwa nke e mere n’okpuru atụmatụ ‘Inspector-General of Police Family Welfare Insurance Scheme’, nke ebumnobi ya bụ iji kwàlite ezi ọnọdụ obibindụ ezinụlọ ndị uweojii ahụ nwụrụ n’ọrụ site n’inyere ha aka.  Atụmatụ ahụ bụkwa nke na-enye aka ịkwalite mmụọ na ọnụnụọkụnobi ndị uweojii ka ha na-arụsi ọrụ ike, burukwa n’obi na ụlọọrụ uweojii bu ọdịmma ha na ndị ezinụlọ ha n’obi.   Ka ọ na-ekesara ndị ahụ akwụkwọ ndọrọ ego ahụ, CP Kuryas kelere onyeisi ndị uweojii, bụ IGP Usman maka ezi agbambọ ya n’ịkwàlìtè ezi ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ uweojii na ndị ezinụlọ ha. Ọ dụkwàzịrị ndị ahụ o kesaara ego

Osote onyeisi uweojii Nigeria abịala njem nleta na steeti Anambra

Image
NWA amadi ahụ a kpọlitere ọhụrụ dịka osote onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, ma bụrụkwa onye na-ahụ maka ngalaba nchọcha na nhazi n’isi ụlọọrụ ndị uweojii Nigeria dị n’Abuja, bụ DIG Ogbonna Amadi agaala njem nleta n’isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti Anambra dị n’Amawbia, Awka South iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ahụ, ma nwekwa mkparịtụka n’etiti ya na ndị uweojii steeti ahụ.   Ya bụ osote onyeisi ndị uweojii bụ onye a nabatara na steeti ahụ site n’aka onyeisi ndị uweojii n’Anambra, bụ CP Echeng Echeng na ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n’ọrụ uweojii, tinyere ndị ọrụ uweojii nọ n’isi ụlọọrụ ahụ.   N’ozi nnọ́ọ̀ ya, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng toro ma kelee DIG Amadi ekele n’ihi mkpọlite ahụ a kpọlitere ya n’ọkwa ọhụrụ ahụ nàkwà mkpọlite a kpọlitere ya dịka onyeisi na-ahụ maka mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ.   Dịka ọ na-ekele ya maka ngalaba ebe dị icheiche o jegoro ozi n’oge gara aga; CP Echeng tòkwàrà onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Alkali Baba Usman maka nkwàdó ọ

CP Anambra ekesàárala ezinụlọ ndị uweojii nwụrụ anwụ ego nkwàdo

ONYEISI ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng Echeng nọrọ na nsonso a wee kesàárá mmadụ iri na atọ, bụ ndị ezinụlọ ndị ọrụ uweojii nwụrụ n’ọrụ uweojii n’ime steeti ahụ akwụkwọ ndọrọ ego nkwàdo ruru nde naịra iteghete na ụma atọ (₦9,300,000).   Ego ahụ bụ nke CP Echeng kesàrà nye ndị ahụ n’aha onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Usman Alkali, ma bụrụkwa e mere n’okpuru atụmatụ ‘Inspector-General of Police Family Welfare Insurance Scheme’, nke ebumnobi ya bụ iji kwàlite ezi ọnọdụ obibindụ ezinụlọ ndị uweojii ahụ nwụrụ n’ọrụ site n’inyere ha aka.   Atụmatụ ahụ bụkwa nke na-enye aka ịkwalite mmụọ na ọnụnụọkụnobi ndị uweojii ka ha na-arụsi ọrụ ike, burukwa n’obi na ụlọọrụ uweojii bu ọdịmma ha na ndị ezinụlọ ha n’obi.   Ka ọ na-ekesara ndị ahụ akwụkwọ ndọrọ ego ahụ, CP Echeng kelere onyeisi ndị uweojii, bụ IGP Akali maka ezi agbambọ ya n’ịkwàlìtè ezi ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ uweojii na ndị ezinụlọ ha. Ọ dụkwàzịrị ndị ahụ o kesaara ego ahụ ọdụ ka ha tinye ya n’ihe ga-abara ha uru ma

Ndị uweojii azọọla ndị ohi atọ a chọrọ ịgba ọkụ n’Anambra

NDỊ uweojii steeti Anambra azọpụtala mmadụ atọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi, ma bụrụkwa ndị ụmụokorobịa atọ chọrọ ịgba ọkụ maka ohi ha zuru.   Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Tochukwu Ikenga, mmadụ atọ ahụ gụnyere Maazị Ifeanyi Nsiegbunam (gbara ahọ iri abụọ na atọ), Maazị Chinemelum Nwafor (gbara ahọ iri abụọ na asaa), Maazị Nnamdi Nwakwesili (gbara ahọ iri anọ), ma bụrụkwa ndị e kwuru na ha jidere otu nwata akwụkwọ Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, Igbariam, ma zuo ya ohi, nakọrọsịa ya ihe niile o ji.   O kwuru na ndị ahụ iwe juru obi jidere mmadụ atọ ahụ ụbọchị Tuesday, tie ha gwoogwoo, ma chọzie ịgba ha ọkụ, tupu ndị uweojii wee wụchaa n’ebe ahụ, ma zọpụta ha n’aka ndị ahụ.   Ọ kọwakwara na ihe dị icheiche e nwetesiri n’aka ha gụnyere otu nsụnsụ egbe, otu daga, akụrụngwa e ji ebe osisi (saw), akpaaka nwaanyị, ekwentị Infinix, na ekwentị Pansonic, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.   N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeis

Aka NDLEA akparala DPO ndị uweojii, ndị ọzọ maka ịtụ mgbere ọgwụike

ỤLỌỌRỤ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchikọọla otu nwoke aha ya bụ Monday George, jibu ọkwa dịka ‘Divisional Police Station (DPO)’ nke Idanre ‘Police station’, steeti Ondo, maka ịtụ mgbere ọgwụike.   Okwuputa okwu NDLEA, Femi Babafemi, n’okwu ya n’Abuja, kwuru na a chụrụ ya bụ nwoke n’ọrụ n’ihi ịdaga iwu n’ihe gbasara ọgwụike.   O kwuru na a nwụchikọrọ ya na onye otu ya, Emmanuel Eniola, gbara afọ iri anọ ka ha ji ọgwụike ‘280 blocks of compressed cannabis weighing 168kg’.   O kwuru sị: “A nwụchikọro ha ụbọchị ụka ọnwa Jenụwarị dị n’abalị iri atọ na Mokwa, steeti Niger, ka e jidere ụgbọala Toyota Avalon ha nke akara ya bụ EKY 429 BZ (Lagos) ka ọ bụ ihe ndị ahụ n’Idanre, ma na-aga Kanji, mpaghara Borgu dị na steeti ahụ.   N’akụkụ ọzọ, Babafemi kwukwara na ndị ọrụ (Narcotic officers) n’ọdụ ụgbọelu Murtala Muhammed International Airport (MMIA), Ikeja, Lagos, kụsara mbọ ụfọdụ ndị na-atụ mgbere ọgwụike chọrọ ibufe ‘methamphetamine Brazil na UK, nke e jidere ha ugboro ugbor

Ndị uweojii azọpụtala mmadụ atọ ndị ntọ zoro n'ime ọhịa Zamfara

MMADỤ atọ ndị ntọ jidere ma zoo n’ime ọhịa Kunchin Kalgo dị na steeti Zamfara abụrụla ndị nweere onwe ha, dịka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ zọpụtàrà ha n’ebe e zoro ha.  Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Mohammed Shehu bụ ya kwupụtara nke a n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, bụkwa nke o sitere na ya kọwaa na ọ bụ oge ndị uweojii ahụ na-awagharị n’ime ọhịa ahụ na-achọ ndị omekoome na ndị e ji eji ka ha hụrụ ma zọpụta mmadụ ise ahụ, bụcha ụmụnwoke.   Dịka ọ na-akọwa na ọ bụ n’okpuru ọchịchị ime obodo Tsafe ka ime ọhịa ahụ dị, o mèkwàrà ka a mara na mmadụ anọ n’ime ndị ahụ a zọpụtàrà bụ ndị sitere okpuru ọchịchị ime obodo Zuru, nke steeti Kebbi, ma bụrụkwa ndị a tọọrọ n’ogologo ụzọ awara awara ahụ siri Yankara gaa Tsafe. O kwukwazịrị na otu onye nke ọzọ bụ onye a tọọrọ na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo Kontagora nke steeti Niger.   Maazị Shehu gàkwàzịrị n’ihu kwuo na ndị ahụ nọrọ mkpụrụ ụbọchị iri na otu n’ime ọhịa ahụ n’aka ndị ahụ tọọrọ ha.

Achọọla ndị uweojii 83 e buliri n'ọkwa mma n’Anambra

 IGBO sị na ezi ọrụ nwèrè ezi ụgwọ; ma sịkwa ọ na-abụ onye e nyèrè mara jide, e nyekwuo ya nke ka nkè.   N’ịgbaso nke a, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng Echeng ejiela ndị uwe ojii ruru mmadụ iri asatọ na atọ (83) n’ọnụọgụgụ ejiji ọhụrụ ma chọkwa ha mma, bụ ndị e buliri ha n’ọkwa ọhụrụ dị icheiche.   Mmemme iji ndị ahụ ejiji ọhụrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị n’Amawbịa, ma bụrụkwa nke e mere n’ịgbasò ntụliaka ahụ onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Alkali Baba Usman nyere ka e bulie ụfọdụ ndị uweojii n’ọkwa na nsonso a, bụkwa nke e mèrè site n’aka ụlọọrụ ‘Police Service Commission (PSC)’.   Mbuli n’ọkwa ọhụrụ ahụ, dịka o siri dòó anya, bụ otu n’ime ụzọ isi ọchịchị ụlọọrụ ndị uweojii n’ala Nigeria si ágbà ndị uweojii ume ka ha na-arụsi ọrụ ike; ma bụrụkwa nke a na-agbaso usoro kwesiri ekwesi na usoro ntozùòkè wee na-eme.   N’okwu ya oge ọ na-eji ha ejiji ọhụrụ ahụ, Maazị Echeng tòrò ndị ahụ e buliri n’ọkwa ọhụrụ, ma chètara ha na

Ndị uweojii ejidela ndị ekperima 28 na Niger

Ndị uweojii na-achọ otu dibịa na mmadụ iri abụọ maka ntọrị, igbu ọchụ n'Anambra

 Ọ NA-ABỤ ọkụkọ nyụọ ahụrụ, ala achụba ya ọsọ.   Ka ọ dị taa, ndị uweojii steeti Anambra ekwuwaala na ha na-achọ otu onye a na-enyo ènyò na ọ bụ dibịa, ya na mmadụ 20 ndị ọzọ achọ ugbua, bụ ndị nọ n’ọsọ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo ènyò na o nwèrè ihe ha ma banyere ọnwụ mmadụ abụọ dapụtàrà na nsonso a n’obodo Ogwu-aniọcha dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru dị na steeti Anambra, ya na ntọ̀rọ́ a tọ̀ọ̀rọ̀ eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Oliver Chike Nnaji (Ezechukwukwadolu, nke atọ).   Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti Anambra, bụ DSP Toochukwu Ikenga bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.   O mere ka a mara na mmadụ abụọ ahụ e gburu egbu n’obodo ahụ na nsonso a bụ Chiifu Ajieh Anthony Nwanasor, na Chiifu Ikenna Ugochukwu; ma rịọkwazie onye ọbụla ma maọbụ nwee ozi ọbụla bara uru banyere onye ọbụla n’ime mmadụ iri abụọ na otu ahụ a na-achọ achọ maọbụ ebe a pụrụ inwete ha, ka onye ahụ kpọtụrụ ma me

Ndị uweojii anwụchikọọla mmadụ ise maka ọnwụ nwaakwụkwọ Dowen Kọleeji

NdỊ uweojii kọmandị Lagos ekwuputala na  ha anwụchikọọla ụmụakwụkwọ ise aka ha dị n’ọnwụ  Sylvester Oromoni (Jnr) nke Dowen College, Lekki. Okwuputa okwu ndị uweojii kọmandị Lagos, CSP Adekunle Ajisebutu, onye kwuputara nke ahụ kwukwara sị na a malitela nnyocha banyere ọnọdụ ahụ dịka ọ kọwara na ụmụakwụkwọ ise ahụ na-enyere ha aka n’ime nnyocha. O kwere nkwa na ndị uweojii kọmandị ahụ ga-eme ihe niile ha kwesịrị ime iji chọpụta otu mmiri siri baa opi ụgbọgụrụ. Ka ọ dị ugbu a, Kọmishọna  uweojii steeti ahụ, Hakeen Odumosu enyela  Divisional Police Officer, Maroko, ntụziaka ka ọ gaa n’ụlọakwụkwọ ahụ maka nnyocha. Dịka otu ọnọdụ ahụ si dị oke mkpa, ahafeela okwu n’aka ndị ọ dị n’aka, Homicide Section nke State Criminal Investigation Department, Panti, ozigbo. Otu o sila dị, otu jikọtara ndị nne na nna n’ụlọakwụkwọ ahụ, akpọọla oku maka ikpenkwụmọtọ n’ebe   Oromoni nọ, tinyere  ịgbanwe ọnọdụ ọchịchị n’ụlọakwụkwọ ahụ. Ndị nne na nna ahụ gara n’ihu kwuo ka a gbanwee ndị nkuzi na-ahụ maka ebe

Na Delta, ndị uweojii azọpụtala agadi nwaanyị n’aka ndị ntọ

NDỊ ọrụ uweojii na steeti Delta steeti anapụtala otu nwanyị dị afọ iri isii na atọ ndị ntọ tọọrọ ma jidekwa otu onye n’ime ndị ntọ ahụ tọọrọ ya, bụ Davidson Odigho.    Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Bright Edafe kwupụtara nke a ụbọchị ụka, ma mekwa ka a mara na onye a na-enyo enyo bụ Davidson Odigho, bụ onye a nwụchiri ka ya na ndị otu ya na-achọkwa ịtọ̀rọ̀ otu nwoke si mba Europe wee lọta na nsonso a.    Ọ sị na ọ bụ n’abalị iri atọ nke ọnwa Nọvemba ka ha nwetara ozi site n’aka onye ọgbaatùmtùm banyere ụmụnwoke abụọ jigasị mma we nwụchie ma jide otu nwaanyị bụ onye obodo Ughelli na mpaghara okporoụzọ ebe dara òwù dị n’akụkụ obodo Irri-Aviara, ma bụrụkwa ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọ. Ọ gara n’ihu kọwaa na ka ha nwetachara ozi ahụ, onye ji ọkwa DPO mpaghara Oleh, bụ SP Paul Oboware kpọkọtara ndị ọrụ ya ngwangwa, wee duru ha na ndị nche obodo Irri, wee gbochie ma gbaa ọhịa dị ebe ahụ gburugburu. Ngwangwa ndị ntọ ahụ hụrụ ha, ha gbahapụrụ on

N'Ihiala, ihe mberede okporo ụzọ mere ebe Ndi uweojịị tụchịrị ụzọ egbuola ọtụtụ, merụọ ndi mmadu ahụ

OPEKATAMPE, mmadụ anọ nwụrụ ọnwụ ike, ebe mmadụ ruru iri na abụọ n’ọnụọgụgụ nwetara mmerụahụ n’ogoogo dị icheiche n’ihe mberede okporoụzọ dapụtara nsonso a na steeti Anambra.   Ihe mberede okporoụzọ ahụ dị egwu bụ nke dapụtara n’akụkụ ogige ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Ihiala gaa Onitsha, n’okpuruọchịchị Ihiala nke steeti ahụ. Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onyeisi ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Commission (FRSC)’ ngalaba nke steeti Anambra, bụ Maazị Adeoye Irelewuyi siri kọwaa, ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara ụgbọala atọ, nke gụnyere bọọsụ Nissan caravan (nwere ákàrà AAH-836-ZV), bọọsụ Nissan caravan ọzọ (nwere akàrà AWK-278-YD) na nnukwu gwongworo (enweghị akara efere) O mere ka a mara na ọ bụ ịgba oke ọsọ na ngharịpụ nke breeki nnukwu ụgbọala gwongworo (Mark Trailer) ahụ kpatara ya bụ ihe mberede okporoụzọ. Dịka Maazị Irelewuyi siri kwuo, ndị ọnọmgbeomere kọwara na ọ onye na-anyà nnukwu gwongworo ahụ hụrụ ndị uweojii n’ihu ebe ha na-akwụsị ma na-enyocha ụ

A gbatuola mmadụ abụọ mgbe ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii

OTU onye nọ n’ogoogo Inspektọ n’ọrụ uweojii nọrọ na nsonso a wee bụrụ onye a gbàgburu agbagbu, ebe otu onye uweojii ọzọ bụkwàzị onye nwetere mmerụahụ oge ndị ojiegbe wakpòrò isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara Unwana dị n’okpuruọchịchị ime obodo Afikpo, nke steeti Ebonyi. Ndị uweojii ahụ gbàgbùkwàzịrị otu onye n’ime ndị omekoome ahụ.   Dịka ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa, ndị ojiegbe á mághị ndị ha bụ, ndị ruru mmadụ iri atọ na ise n’ọnụọgụgụ wakpòrò ya bụ ngalaba isi ụlọọrụ ndị uweojii n’ihe dịka elekere atọ nke ọnụ ụtụtụ ụbọchị ụka; ha na ndị uweojii wee malite ịkwà mgbọ.   N’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti ahụ, bụ DSP Odah Loveth gbàrà akaebe na ihe ahụ mèrè eme n’ezie, ma kọwaa na ndị uweojii gbàgbùrù otu onye n’ime ndị omekoome ahụ oge ahụ ha na ha na-akwàrịta mgbọ n’ime abalị ahụ, ebe ndị nke ọzọ búkwàzịrị àpà mgbọ n’ụdị dị icheiche wee rie mbọmbọ ọsọ.   Kaosiladị, o mekwara ka a mara na ndị omekoome ahụ j

Ndị uweojii ejidela ndị a na-enyo ènyò makaigbu ndị mmadụ n'Abuja

 AKA ndị uweojii akpàrala mmadụ atọ a na-enyo enyò na ha bụ ogbu mmadụ, ma bụrụkwa ndị aka ha dị n’ọnwụ nwoke ahụ a mà àmá na-esi nri gwòògwòò n’Abuja, bụ Maazị Vincent Eluagu Chukwuemeka, onye e ji ‘Chef Emeka’ wee mara.   Ọ dị ncheta na a hụrụ ozu Chef Emeka n’ime be ya dị n’Abuja, n’abalị iri abụọ nke ọnwa Ọgọstụ ahọ a n’Abuja bụ isi obodo ala Nigeria.   Nke a mezịrị ndị uweojii, ngalaba FCT jiri màlite ime nnyocha miri èmì banyere ọnwụ mberede nwa amadi ahụ, ji chọpụta ka o siri nwụọ, ihe kpatara ọnwụ ya, maọbụ ndị aka dị na ya bụ ọnwụ.   N’ozi a kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a n’Abụja site n’aka onye na-ahụ mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na FCT, bụ DSP Josephine Adeh, e mere ka a mara na ndị uweojii ahụ anwụchiela mmadụ atọ a na-enyo ènyò na aka ha dị n’ọnwụ nwa amadi ahụ.   Ọ kpọpụtasịrị aha ndị ahụ dịka Kingsley Obinna (gbara ahọ iri abụọ na anọ), Musa Tanimu (gbara ahọ iri abụọ na ise) na Mohammed Sha’aba (gbara ahọ iri abụọ na isii).   Ọ kọwara na site na nnyocha ndị na-ah

Na Delta, aka ndị uweojii akparala nwa okorobịa chọrọ ighụpụta nne ya anya maka ọgwụ ego

OTU ikorobịa aha ya bụ Emma Eregarnoma kpọkuru nne ya, Oriakụ Oke Eregarnoma ka ọ bịa n’ụlọ ya nke dị n’Okuokoko na steeti Delta ka ọ kọwachaara ya na o nwere ihe ntụmadi o debeere ya.   Nwaanyị ahụ kwuru na ka ya ruru ebe ahụ na ya hụtara nwa ya nwoke ahụ bụ Emma onye ọ kọwara dịka onye ‘yahoo’ n’ọnọdụ oke ọńụ edoghị anya, ka ọ nabatachara ya. O kwuru na ọ gbalitere ngwa egwu ya elu, ozigbo ma kpọchikwaa ụzọ. Ka nke ahụ gachara, ọ gbara mbọ ịtọgbu ma ghụpụta ya mkpụrụ anya abụọ. Onweghị onye nuru olu ya dịka ọ na-eti mkpu n’ihi egwu ahụ ọ gbaliri elu ma bụrụ nke na-agụsi ike.   Nwaanyị ahụ gara n’ihu kọwaa na dịka ya lụsochara nwa ya ọgụ, nkeji olemole, na ya nwetakwara ike were gbapụ iro iji nweta enyemaka, nke mere ka ndị agbataobi gbata ma zọpụta ya.     Oriakụ Eregarnoma ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ banyere ya bụ ihe site n’àkwà ya n’ụlọọgwụ chetara na tupu nwa ya awakpo ya na o turu ọnụ ma kwuo sị na ọ ga-agbarịrị ụgbọala GLK n’izuụka a.   Otu o sila dị, ndịuweojii anwụchịkọọla ya b

Na Delta, ndị uweojii ejidela ndị otu nzuzo ebe ha na-anabata ndị ọhụrụ

NDỊ uweojii steeti Delta anwụchikọọla ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo na ndị omekoome n’ebe nzuzo ha dị n’ime ọhịa, oge ha na-anabata ndị ọhụrụ n’otu nzuzo ha.   Ndị ahụ e jidere ruru mmadụ iri n’ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ n’ime anyasị n’obodo Onicha-Ugbo dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Aniocha North’ nke steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo ènyò na ha bụcha ndị otu nzuzo Aiye, ndị e jiri ‘Black Axe’ wee mara.  Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Delta, bụ DSP Bright Edafe bụ ya mèrè ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na steeti ahụ, n’aha onyeisi ndị uweojii n’ime steeti ahụ, bụ CP Ari Mohammed Ali.   O mere ka a mara na e nwetere ótù nsụnsụ egbe n’aka ndị ahụ, tinyere ọtụtụ mgbọ egbe dị icheiche site n’aka mmadụ abụọ n’ime ndị otu nzuzo ahụ. O kwukwara na e nwetara anwụrụ ike, otu ụgbọala ‘Honda Accord’ (nwere akàrà Lagos KSF 586 DU), ọgbatumtum ise na otu àkpa osikapa ákwà juru n’ime ya n’ebe ahụ ndị otu nzuzo ahụ nọ eme y

N'Adamawa, ndị uweojii ejidela ndị abaliịegwu atọ

NDỊ uweojii anwụchiela mmadụ atọ na steeti Adamawa, bụ ndị a na-enyo ènyo na ha bụ ndị ohi ji abalị aga n’ụlọ n’ụlọ ezu ndị mmadụ ohi.   Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Adamawa, bụ DSP Suleiman Nguroje bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na Yola bụ isi obodo steeti ahụ, ụbọchị ụka.   Ọ kpọpụtasịrị aha ndị ohi ahụ dịka Kalifa Mustapha (gbara ahọ iri abụọ); Tumba Abubakar (gbara ahọ iri abụọ na asaa); na Faisal Abdullahi (gbara ahọ iri abụọ na otu), ma kwuo na ha bì na mpaghara Shagari Phase 1, Phase 2 na Abuja Street dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Yola South’, ma bụrụkwa ọkaibe n’izu ohi abalị.   O kwuru na onyeisi ndị uweojii e wetara ọhụrụ na steeti ahụ, bụ CP Mohammed Ahmed Barde zigara ndị ọrụ uweojii nọ na mpaghara Yola, bụkwazị ebe ha nọrọ wee nwụchie mmadụ atọ.   Ọ kọwara na nnyocha e mere na-egosi na mmadụ atọ ahụ sò n’òtù ndị ohi mmadụ asaa zuru ohi dị egwu n’ụlọ ruru iri abụọ na abụọ n’ọnụọgụgụ n’ime ọnwa atọ gara aga, ma zukọsịa ọtụtụ ihe dị ic