Posts

Showing posts with the label Ndị omekome

Gọọmenti etikpọọla ngwuru ndị omekome n'Oba

Image
GỌỌMENTI steeti Anambra ewelitekwuola aka n’agha ahụ ọ na-ebu megide ndị omekome nà ndị ọzọ na-eme mpụ dị icheiche na steeti, dịka ọ wakporo, kụtuo ma bibie otu n’ime ebe nzuzo ndị ntọ na steeti ahụ.   Mwakpo ahụ na ịkwatu ebe nzuzo ahụ bụ nke ndị ọrụ nchekwa dị icheiche jikọtara aka ọnụ wee mee n’Oba, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Idemmili South nke steeti ahụ, bụ ebe ha kwaturu otu ụlọ ala ebe ndị omempụ ahụ jiri mere ebe nzuzo na ebe ha na-edebesi ụfọdụ ndị mmadụ ha tọ̀tàrà.   Tupu a kwatuo ụlọ ahụ, ndị ọrụ nchekwa ahụ bu ụzọ wakpo ụlọ ahụ, bụkwa ebe ha jidere ụfọdụ ndị omekome ahụ na ndị ọzọ a na-enyo enyo na ha na ha na-arụkọ. Ihe dị icheiche e nwetekwara n’ebe ahụ gụnyere ụdị mma dị icheiche, egbe, okwu arụsị, anwụrụ̀ ike, ụdị ekwentị dị icheiche, ọkụ, ego, ọgwụ a gwọrọ agwọ, mgbọ egbe a gbabeghị agba, m̀kpà, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ.   Ndị omempụ ahụ ka e kwuru na ọ bụ ha kpara ọtụtụ mkpamkpa a kpagasịrị n’akụkụ ebe dị icheiche na steeti ahụ Anambra na nsonso a, nke gụnyere ọrụ ịtọ̀r

Na Kogi, ndị nta ejidela ndị omekoome anọ

IGBO sị na agbataobi onye bụ onye nche ya.   N’ịgbasò nke a, ndị na-achụ nta n’okpuru ọchịchị Okehi nke steeti Kogi nọrọ na nsonso a wee nwụchikọọ mmadụ anọ, bụ ndị omekoome na-eyi ndị na-anyà ụgbọala égwù ma na-emekpàkwa ha ahụ na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siri Okene gaa Lokoja na steeti ahụ.   Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ọnụ odeakwụkwọ mgbasaozi Gọvanọ steeti ahụ, bụ Maazị Onogwu Mohammed, bụ onye kwuputàrà ya site n’ozi ọ kụpụrụ n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ Facebook ya.   O mere ka a mara na ndị nta ahụ nọkwara n’abalị ahụ wee bibie ọhịa ebe ha jiri mere ugbo ebe a na-akọpụta ìgbó, bụ nke ndị omekoome ahụ nwe, ma bụrụkwa ebe ha na-emepta ọgwụ ike dị iche iche.   Dịka o siri kọwaa, ndị omekoome ahụ nwèkwàrà ụdị nkịta pụrụ iche ha na-azụ n’ebe ahụ maka ịtàgbù na ịchụpụ onye ọbụla tinyere ụkwụ ebe ahụ maọbụ wakpo ha n’ebe ahụ.   Ọ gara n’ihụ kọwaa na oge ndị nta ahụ wakpòrò ebe ahụ, na ha nwụchikọrọ mmadụ anọ n’ime mmadụ ndị omekoome iri nọ n’ebe ahụ, ma gbuo nkịta is

Ndị omekome amaala mmadụ atọ elu n'ike, ma gbuo onye nche n'ogige ụmụaka enwe nne enwe nna

IHE karịrị ụmụnwoke iri na abụọ awakpola ogige ndị enwe nne na nna (orphanage) nke mba US dị n’isiobodo Haiti. Ha gburu otu onye nche ma kwaa ụmụaka abụọ na otu nwaanyị iko n’ike.   Onye nlekọta (manager) ogige ahụ bụ Brayann Clerge kwuru na ụmụaka ahụ nọ n’ọnọdụ oke mwute na echicheugbu a. Ọ kọwara na ụmụnwoke ahụ kwara ụmụaka enwe nne na nna abụọ dị afọ iri na atọ na iri na anọ, tinyere otu nwaanyị na-arụ ọrụ ebe ahụ dị afọ iri abụọ na asaa iko n’ike. O kwuru na onye nche ahụ ha gburu gbara afọ iri anọ na isii, ma jide ụmụ isii.   Clerge kwụkwara na ndị omekome ahụ tupu ha hapụ ogige ahụ zuuru mgbaaka agbamakwụkwọ ya (wedding ring), otu onyoonyoo tiivii na ihe karịrị dọla dị otu puku na narị ise ($1,500); ma tie ya na nwunye ya ihe.   Ebe obibi ndị enwe nne na nna ahụ ka e kwuru na ọ bụ ndị Global Mission, n’enweghị òtù ụka ọ bụ n’iche nọ n’Orange Country, California na-ahụ ma na-elekọta ya.   Onyeisi (Director) bụ Dave Brodsty gwara ndị ntaakụkọ na ọrụ ha bụ ilekọta ụmụaka a gbahapụ