Ndị omebe iwu Anambra anabàtala aha ndị isi oche nchere oge ọhụụ
NDỊ ụlọ ọgbakọ omebe steeti Anambra nọrọ ụbọchị n’izu ụka gara aga wee nabata aha ndị isi oche nchere oge ọhụụ govanọ Willie Obianọ ziteere ha maka okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ. N’okwu ya dịka ha na-anabata aha ndị ahụ, osote ọka okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ, bụ maazị Harford Oseke, onye nọ n’isi ya bụ ọgbakọ tụụrụ ndị ahụ mmamma maka ịbụ ndị a hụtara dịka ndị tozùrù òkè iji ya bụ ọkwa dị oke elu. Ọ dụkwàzịrị ha ka ha dị uchu n’ọrụ ha ma gbasie mbọ ike rụpụta ihe a hụrụ anya, ọ bụnadị karịa otu ọ dị tupuu ugbu a, iji gwaa aka n’ịkwàlite ya bụ ezi mbọ esepughị aka gọvanọ Obianọ na-agba n’ịkwàlite steeti ahụ ka ọ bụrụ eji ama àtụ. N’ozi ekele ya, onyeisi nchere oge n’okpuru ọchịchị Idemili North, bụ maazị Raphael Nnabụife kelèrè ndị omebe iwu ahụ maka ịhụta ha dịka ndị tozùrù òkè iji ya bụ ọkwa dị elu, ma kwekwazie nkwà na ha ga-arụ ọrụ ha nke ọma iji mezuputa ezi ntụkwasị obi ahụ gọvanọ Obianọ nwere n’ebe ha nọ wee nye ha ya bụ ọkwa. Na ntụnye nke, nwa amadi e n