Ndị ntaakụkọ steeti Anambra emeela emume ụbọchị mgbasaozi n'Awka
…Ige ntị bụ isi mmekọ mmadụ na ibe ya – Kọmịshọna Nwosu ỤBỌCHỊ ụka ka e mere emume Ụbọchị Mgbasaozi n’ụwa niile. Ọ bụ ụbọchị a na-ewepụta afọ ọbụla maka ihe gbasara mgbasaozi na ụzọ a ga-esi me ka ọ na-aga werewere. Ahọ ọbụla, Poopu na-ezi ozi gbasara ya. Na mmemme ahụ nke afọ a, Poopu Francis kpọkuru ndị mmadụ ka ha nwee mmụọ ige ntị, bụ nke o kwuru na ọ dị oke mkpa, ná mgbasaozi. N’ozi ahụ, Poopu rụtụrụ aka na ụwa ejichazịghị ige ntị kpọrọ ihe, ma kọwaa ige ntị dịka ihe bara nnukwu uru maka inwe ezi nghọta. Na steeti Anambra, ndị otu ahụ jikọtara ndị ntaakụkọ, Nigerian Union of Journalists (NUJ), kara ụka ma tụọ mmamma n’obi Chukwu, St Patrick’s Cathedral, Awka. N’okwuchukwu ya, Bishọp ụka Katọlik na dayọsis Awka, Most Rev. Paulinus Ezeokafor gbadòrò ụkwụ n’isiokwu ahụ bụ Ige Ntị wee kọwaa na ọ bụ site n’ige ntị ka e si enwe ezi nghọta, ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha jiri ige ntị kpọrọ ihe. N’otu aka ahụkwa, Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasaozi na steeti Anambra, Maazị Paul Nwosu kọwàkw