'Keke Napep' agbabaala n'ime ọwa mmiri, merụọ mmadụ abụọ ahụ
KEKE Napep bu mmadụ anọ ma burukwa akara ụgbọala KPP-840QVewerela ọsọ gbabaa n’ime ọwa mmiri ma merụọ mmadụ abụo ahụ ụbọchi Mọnde. Nke a mere n’ihu Anambra Newspepers and Printing Corporation(ANPC), ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa nakwaSportsLight Xtra. Dika e si kọwaa, onye ọkwọ ụgbọala ahụ gbara ọsọ nke ukwuun’ejideghị njikwa ụgbọala ahụ nke ọma. Otu onye nọ n’ụgbọalaahụ aha ya bụ Hadi Mohammed sitere na Sarduana dị na steeti Taraba kọwara na ọkarịbeghI otu ọnwa ọkwọ ụgbọalaahụ butere ụgbọala a N’okwu ya, ọ sịrị“Anọ m n’ime Keke oge ọ na-anya ya. Ọ chọrọ ka ọ tugharịa ibute onye ọzọ ọmaara. E nyere m aka iji gbochie ihe mberede a ma gwa ya ka o jiri nwayọọ tupu ọtụbanyeKeke m n’ime ọwa mmiri”. Mohammed kwukwazịrịna ihe mberede a merụrụ mmadụ abụọ arụ nke onye otu ya a kpọrọ ‘Homeboy’ so naya.