Posts

Showing posts with the label Ndị fada nọ n'ime-ime obodo

Ndị fada nọ n'ime-ime obodo nwere ike ịlụ nwaanyị – Pope Francis

DỊKA a sị na ọnọdụ dịba àñaa, e nyebere onye nke ya kacha njọ aka, onyeisi ụka Katọliiki n’ụwa gbaa gburugburu, bụ ‘Pope’ Francis emeela ka a mara na ndị ụkọchukwu  (Fada) ndị nọ n’ime-ime obodo nwezịrị ike ịlụ nwaanyị n’ọnọdọ dị añaa, iji nyere ndụ ha na ọrụ ha aka. Pope mere ka a mara nke a n’okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ ụbọchị Mọnde n’ime ụgbọelu oge ọ na-eme njem ga-ewe ya abalị isii ịgaru Panama bụ nke dị na mpaghara Central America n’ebe nkèwa Ohimiri Caribbean na Ogbu Mmiri Pacific. O kwùrù na ya agaghị anọgide tie aka n’ikè sị ka ndị ụkọchukwuu (Fada) niile lụbazie nwaanyị n’ihi na nke ahụ ga-anọ ọdụ ka mmadụ ịgbakụta chi ya azụ ma nye mkpebi nke aka ya, dịka ọ ghọtara na a sị onye buru chi ya ụzọ, ọ gbagbuo onwe ya n’ọsọ. Otu ọ dị, o kwuru na o nwere ndị ọnọdụ ha dị iche, ọ kachasị n’ime-ime obodo dị iche iche dịka Amazọn na ụfọdụ mpaghara Pacific dịpụgara adịpụga, bụ ebe adịghịdị enwete ndị fada ga-aka ụka ma ya fọdụzie ime ihe ndị ọzọ a na-eme n’ụlọ ụka. O kwuzịrị na n’ihi nke