Ndị eze etoola Obianọ maka ọchịchị ọma
Kwe nkwa ịkwàdò ya OTU jikọtara ndị eze ọdịnala na steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ n’ihi ọtụtụ ọrụ ọma dị iche iche o ji n’aka nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ o mepụtagoro na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ. Ndị otu a kpọrọ oku a ma kwe nkwa ahụ na nnukwu ọgbakọ ha chịkọbara, bụ ọgbakọ izugbe maka ndị eze ọdịnala nile nke steeti ahụ, nke ahọ 2018, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’isi ụlọ ọrụ ha dị n’obi gọọmenti, n’Awka. N’ozi nnọọ ya na mmemme ahụ isi okwu ya bụ, “Nturu Ugo Dara Ụda Nke Gọvanọ Willie Obianọ Nakwa Ịkwalite Mmepe Na Ịdị n’Otu Nke Ala Igbo”, onyeisi ndị otu ahụ ma bụrụkwa eze ọdịnala Onitsha, bụ Igwe Nnaemeka Achebe, mere ka a mara na Gọvanọ Obianọ emeela steeti ahụ ka ọ bụrụ e ji ama atụ n’ihe gbaaara ezi ọchịchị, ọrụ ugbo, nchekwa, mmepe ime ime obodo, igwu okwe ndọrọ ndọrọ ghe anya oghe na ihe ndị ọzọ, ma kwuo na ha nwere olile anya na ọ ga-eduru steeti ahụ na ndị igbo baa n’ala e kwere na nkwa. O kwuru na ha chọrọ ịnọ n’ọgbakọ ahụ wee k