Ndị dịbịa obidola mepebe ụlọ ụka?
ỌTỤTỤ ụka dị iche iche juputara n’elu ụwa taa. Onye ọbụla chọrọ ibido ụlọụka nke ya. Ịbata n’otu obere obodo, ụlọụka adị iri n’ọnụọgụ, okporoụzọ obodo atụrụ (township) niile ụlọụka aka nri, aka ekpe. N’ihi gịnị? Onye ọbụla chọrọ inwe ụlọụka nke ya. Ị jụọ ya, ọ si na ya nwere ọkpụkpọ oku site n’aka Chineke. Ihe ndị a nile bụ oke ọchịchọ n’ihi na ọbụghị iwu na onye ọbụla nwere ọkpụkpọ oku ga-emeghe ụlọụka nke ya makana ọ bụ otu akwụkwọnsọ ka e nwere, ọdịghị abụọ. Otu Chukwu dị nke kere mmadụ niile. Kemgbe ụka ọgbara ọhụrụ batara ka ihe ọjọọ ji malite mụbawa karịa ka ọ dị na mbụ. Okwu asị, wayo, ntọrị, akwamiko, igbu ọchụ, w.d.g bụzị ụkwa a chị n’aka. Ọtụtụ ndị isi ụka sị na Chineke kpọrọ ha oku bụ ekwensu kpọrọ ha oku ahụ, ha jirizie Chineke na-etigharị ndị mmadụ anya. Ọ bụ eziokwu na ihe ọjọọ dị kemgbe e kere ụwa mana ọtụtụ ụka ọgbara ọhụrụ na-ewepụtazi atụmatụ abụghị ntọala ndị otu Kristi. Ha na-eji ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ ihe ọjọọ wee na-alụ ọlụ. Otu onyeisiụka kwuru na ya