Posts

Showing posts with the label Ndị Umuchu

Korona: Ndị Umuchu enyela ụfọdụ ụmụafọ nkwanyeugwu maka ezi ọrụ

IGBO sị na ọ na-abụ e kelee onye gburu ehi, ọ hụ ewu o gbuo; ma sịkwa na ọ na-abụ a kwanyere dike ùgwù maka ihe dị ike o mere, o mee karịa.   N’ịgbaso nke a, ndị obodo Ụmụchu dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Agụata na steeti Anambra enyela asambodo nkwanyeugwu nyegara ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ, ndị gbara mbọ ma nyekwa nkwàdo n’ụzọ dị iche iche n’ime oge a ọrịa nje korona mere ndị mmadụ mkpamkpa dị egwu n’ụzọ dị iche iche.   Mmemme inye nkwanyeugwu ahụ e mere na nsonso a bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumeezu obodo ahụ (bụ ‘Umuchu Town Hall’) ma bụrụ nke a nọkwara na ya wee kpọpụta ndị tuuru ùgò n’asọmpi ‘raffle draw’ ndị obodo ahụ chịkọbara iji mee ihe obiañụrị ma kwàlitekwa ezi ọnọdụ mmekọrịta na ịdịnotu n’obodo ahụ.   Oge ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, eze ọdịnala Ụmụchu, bụ Igwe Godson Ezechukwu sị na ebumnobi nkwanyeugwu ahụ bụ iji kelee ha maka ezi ntụnye dara ụda ha mere n’agha ahụ a na-ebu megide ọrịa korona, na n’ịkwàlite ezi ọnọdụ nchekwa na mmepe obodo ahụ n’ụzọ dị iche iche.   Dịka ọ na