Posts

Showing posts with the label Ndị Omenka

Otu ndị omenka na Nigeria, SNA abịala njem nnọkọrịta na nke onyeisi ụlọọrụ ANPC

ONYEISI ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka ỌDị Taa nakwa SportsLight Xtra,  Chuka Nnabuife anabatala ndị otu Society of Nigerian Artist n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka ụnyaahụ. Onye bụ SSA nyere Gọvanọna n’ihe gbasatara Post Primary Education bụ Dr. Paul Ifeanyi nọkwazị oge ahụ. Njem otu ahụ ngalaba steeti Anambra mere gụnyere onyeisi ha bụ Uchechukwu Ezeemo, ode akwụkwọ ha, Chukwudi Onyendi nakwa Chidi Owuekwe. Oge ọ na agwa onyeisi ụlọọrụ ANPC okwu, Uchechukwu Ezeemo kwuru na ọ bụ ohere ha ji aga ebe dịgasị iche iche iji zute ndị otu ha nwelitere isi n’ihe osise (Art), ndị nwere agba na gọọmenti maọbụ ndị hụrụ ya n’anya, tinyere ọtụtụ ụlọakwụkwa iji gosi nkpa ọ dị ha ịmata uru dị na ya. N’okwu ya, ọ sịrị, “Ọ dị ihe atọ mere anyị jị bịa taa. Nke a gụnyere ka anyị na gị nọkọọ dịka onye otu anyị nakwa onyeisi ụlọọrụ ANPC. Ka anyị na gị kpaa aro maka ihe ngosi (exhibition) anyị ga-eme ma mkpụrụ ụbọchị dị n’iri abụọ na ise n’ime