Ihe kpatara e ji enye ndị okenye nsọpụrụ
NDỊ Igbo kwenyere na ndị okenye dị nnukwu mkpa na ndụ ha. Ọ bụ ndị okenye nọ n’etiti ha na ndị nna nna ochie. Ha maara iwu obodo na ihe niile ọha na eze kwesịrị ị na-eme. Ha maara ọtụtụ ihe nke ụfọdụ ndị mmadụ amaghị. Ọ bụ ọnọdụ ndị okenye ka Igbo jiri kwuo si na ihe okenye nọ n’ala hụ na nwata rigoro elu osisi ọ gaghị ahụ ya. Site n’ọnọdụ ndị okenye ka ndị nna nna anyị si agwa anyị okwu n’ihi na ha na ha na-erikọ nri. Ihe ndị a pụtara na ndị okenye nọ n’etiti/agbata ndị mmadụ na ndị mmụọ. Mgbe ọbụla a na-akpa ihe dị mkpa n’ezinaụlọ ma n’ọha obodo ọ bụ ndị okenye ngọzị n’ebe ezinaụlọ na obodo ha nọ. Anya a na-asọ ha na-eme ka ihe ọjọọ na-ebelata. Ọ bụ ya mere Igbo jiri tụọ ilu sị na ọ bụrụ na okenye anọghị n’ụlọ na ụmụaka gaara igbu udele rie ya dịka anụ. A maara ndị okenye dịka ndị na-akwụba aka ha ọtọ site n’ikwu eziokwu. Ọ bụ ha na-akọwapụta omenala ndị Igbo dị iche iche, ebe ụmụaka na ndị ntorobịa na-elere ha anya were na-etolite n’ozuzu oke. Amamihe ha na-adị elu karịa nke ony