Posts

Showing posts with the label Ndị Ntorobịa

E nyela ndị ntorobịa ruru narị ise ọzụzụ na ego nkwàdó n'Anambra

 NDỊ ntorobịa ruru narị ise nọrọ na nsonso a wee nweta ọzụzụ maka ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha na steeti Anambra.   Ya bụ mmemme inye ọzụzụ bụ nke a chịkọbara n’okpuru atụmatụ ‘Anambra COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (AN-CARES)’ site n’aka ngalaba ‘Anambra State Cash Transfer Unit’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke e mere site na njikọaka ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ akụnụba na amụma ego ọrụ (Ministry of Economic Planning and Budget) na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze n’Anambra (Ministry of Women and Social Welfare).   Ọzụzụ ahụ were mkpụrụ ụbọchị anọ bụ nke a chịkọtara n’obodo Isuanịọcha dị n’okpuruọchịchị obodo Awka North.   Atụmatụ ‘Anambra COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (AN-CARES)’ bụ otu n’ime atụmatụ nkwàdo dị n’okpuru atụmatụ ‘Nigeria COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (N-CARES)’, bụkwa nke na-enweta nkwàdo site n’aka ụlọ ọba ego mba ụwa (World Bank), ma bụrụkwa nke a na-ekesà nkwàdo ya n’ime steeti dị icheiche dị n’

N'Obosi, ụmụokorobịa awakpòla, kwatuo ụlọụka maka nsogbu ókè ala

Image
NDỊ ntorobịa iwe juru obi nọrọ na nsonso a wee wakpò ma bibie otu ụlọụka a maara dịka ‘Olu Ndi Enigwe Adoration Ministry’ dị n’Obosi, n’okpuruọchịchị ‘Idemili North’ nke steeti Anambra, n’ihi nsogbu ịzọ oke ala na-adapụta n’etiti ndị obodo ahụ na ndị nwe ụlọ ụka ahụ, bụ nke binwuuru ọkụ na nsonso a.   Ya bụ nsogbu oke ahụ bụ nke malitere kemgbe, ma bụrụkwa nke ka na-agawanye n’ihu ugbua n’agbànyèghị ntụnye dị icheiche na oku ikpe udo niile ndị e ji okwu ha agba izu kpọgoro n’etiti ndị ụka ahụ na ndị obodo ahụ, ma nke e mere site n’aka Ashbishọọpụ Valerian Okeke nke ụka Katọliki na Dayọsis Ọnitsha, na ụfọdụ ndị ọzọ.   N’agbànyèghị mgbataọsọ niile ahụ, akụkọ kọzịrị na ndị ntorobịa Obosi jiri iwe, buru katapịla, wee ga kwatuo ụlọụka ahụ, tikpọ̀sịa ihe dị icheiche e ji aka ụka n’ebe ahụ, ma tikwa ụfọdụ ndị ụka ahụ nọ ebe ahụ ihe tupu chụpụ ha n’ala ahụ.   N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere nke ahụ, onye mgbazi nke ime mmụọ n’ụlọụka ahụ, bụ Rev. Fr. Jude Uche Olundienigwe kọwara na ala ebe

Ndị ntorobịa Anambra ekwela nkwa inye aka kwụsị mpụ na arụ

NDỊ ntorobịa Anambra a maara dịka ‘Anambra Youths Volunteers’ ekwela nkwà na ha ga-adọnyere ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ, nke Ọkammụta Chukwuma Soludo nọ n’isi ya úkwù ma nye ya nkwàdo zuru òkè ná nzọpụ̀ ụkwụ ahụ ọ zọpụgoro ibu agha megide ịna ụtụ aghara aghara, mpụ na arụrụala na steeti ahụ.   Ndị òtù a kwupụtara nke a oge ha nwere ọgbakọ pụrụ iche n’Onitsha, bụ ebe ha nọrọ wee kwuo na ha wàtàrà ọgọdọ iweghàchite udo tọrọ àtọ na steeti ahụ, ya na inye ndị omekoome ọsọ ụkwụ erughịala.   N’okwu ya n’ebe ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Maazị Chukwuma Okpalaezeukwu mere ka a mara na ha ga-elebàkarị anya n’ihe gbasaara okporoụzọ, na ileru anya etu ihe si aga na steeti ahụ, dịka o siri metụta akparmagwa ndị omekoome.   O kwuru na ihe ha jiri me mkpebi ahụ bụ maka nkwuwa ahụ Gọvanọ Soludo na ọ màchiela ọrụ ndị ọnaụtụ iwu akwadòghị na ndị ọzọ na-etinye aka na mpụ na arụrụala ndị ọzọ; bụkwa nke onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Echeng Echeng nyegoro ndị ọrụ ya ntụziaka ka ha malite itiny

Ndị ntorobịa agbaala ụlọ nwoke gburu onye isi mgbaka ọkụ

NJINJI jiri n’Ikem Ogor dị n’okpuru ọchịchị Isi-Uzo na steeti Enugu ka ndị ntorobịa iwe na-ewe gbara ụlọ otu nwoke aha ya bụ Lawrence Ezeoha, onye a maara dịka ‘Oshionwu’ ọkụ maka igbu nwa na-eto eto, nwere ọrịa isi mgbaka.   Nwoke ahụ (Oshionwu) gbara afọ iri asaa ka e kwuru na ọ gbagburu Ifeanyi gbara afọ iri na iteghete onye e ji Agudo wee mara maka na o boro ya ebubo na ọ bụ ya mere ya ọrịa isi mgbaka ahụ ọ na-arịa.   Dịka otu onye ogbe ahụ siri kwu, ya bụ onye lara mmụọ na-anyabu ọgbatumtum e ji akpata ego (ọkada) tupu ọrịa isi mgbaka amalite rịaba ya, ọnwa olemole gara aga.   Nsogbu malitere otu ụbọchị ka Ifeanyi bịara be Ezeoha n’oge ụtụtụ ma jụ isi ebe ahụ laa. E kwuru na ọ malitere na-ebo Ezeoha ebubo na ọ bụ ya mere ya ihe na-eme ya.   Nke ahụ mere na Ezeoha were iwe, n’ihi na Ifeanyi ekweghị ahapụ be ya, ọ bara ime ụlọ wepụta egbe (dane gun) ya, gbaa Ifeanyi na mkpuruobi.   Dịka otu onye ogbe ahụ siri kwu: “Ụfọdụ ụmụikorobịa buru ya ga ụlọọgwụ ọha na eze, Ikem General Hospit

Ndị ntorobịa ejirila iwe suo ụgbọala ọkụ n'Onitsha maka igbu mmadụ

IGBO sị na ọ bụrụ na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ejiri ya mere anụ ma n’udummiri ma n’ọkọchị.   Ọ bụ n’ịgbaso nke a ka ụmụokorobịa jiri were iwe gbaa otu nnukwu ụgbọala àkpà nnu jupụtara n’ime ya ọkụ n’Ọnịcha, dị na steeti Anambra maka ịkụgbu otu onye na-akwa barò n’Ọnịcha n’ihe mberede okporo ụzọ dapụtara n’ebe ahụ.   Onye na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’ na steeti Anambra, bụ Maazị Kamal Musa kwupụtara nke a n’ozi ọ kụpụrụ na nsonso a banyere nke ahụ.   Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede bụ nke dapụtara n’ụtụtụ ụbọchị Tuzdee, ma bụrụkwa nke nnukwu ụgbọala ahụ, bụ ụgbọala Dangote (enweghị akara efere ọbụla) sitere na ya wee kụgbuo ya bụ nwa amadi na-agbara onwe ya mbọ n’Ọnịcha, na nso ụlọ ọba ego Zenith, na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Ọnịcha gaa Owerri.   Ndị ọnọmgbeomere na-akọwa na-akọwa na ọ bụ ịgba oke ọsọ mere ihe mberede okporo ụzọ ahụ jiri dapụta, n’ihi na ọ nọ n’oké ọsọ, nke mezịrị ka ọ pụọ na mpaghara ụzọ ebe

E nyela ndị ntorobịa Anambra ọzụzụ maka ịzụ añụ

ỌZỤZỤ otu ụbọchị a chịkọbara maka ndị ntorobịa steetiAnambra bànyere etu e si azụ añụ abịala n’isi njedobe, dịka a kpọrọ òkù ka etinye uchu n’ihe gbasaara ịzụ añụ na iji ya akpa ego site n’ụzọ dị iche iche.   Ya bụ ọzụzụ bụ nke achịkọbàra n’okpuru ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ugbo n’ime steeti ahụ, ma bụrụkwa nkendị ntorobịa karịrị iri ise n’ọnụ ọgụgụ sitere okpuruọchịchị ime obodo iri abụọna otu dị na steeti ahụ sonyere na ya.   Ka ọ na-ekwu okwubànyere ọzụzụ ahụ, Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ ugbo, isucha ihe a kọtàràn’ugbo na ibupu ya mba ofesi, bụ Maazị Nnamdị Ọnụkwụba mèrè ka a mara na ya bụatụmatụ bụ nke dabàrà adaba n’ezi agbambọ na ebumnobi ọchịchị nọ ugbua nasteeti ahụ ịkwàlite ọrụ ugbo n’ime steeti ahụ, ya na ime ka ndị ntorobịa nweeihe ha na-arụ, ma sikwa n’ụzọ dị otu ahụ kwàlite mmepe obodo.   O mekwara ka a marana a ga-aga n’ihu n’inye ọzụzụ ahụ na mgbe na mgbe, iji mee ka ọtụtụ ndị ntorobịasonyekwuo ma ritekwa úrù na ya, ọbụnadị dịka ọ kpọkuru ndị natara ya bụ ọzụzụugbua

Obianọ ekwenwòóla nkwà ịkwàdò ndị ntorobịa, ụmụnwaanyị

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọekwunwòóla ezi njikere ya ịkwàdò na ịkwàlìtekwù ọtụtụ ndị ntorobịa na ụmụnwaanyịsteeti ahụ, site n’ime ka ha sòro n’ihe a na-eme n’ime ahọ abụọ fọdụụrụ ọchịchịya na steeti ahụ.   Ya bụ aka na-achịachị kwupụtàra nke a na nnukwu ọgbakọ weere ọnọdụ nso-nso a n’ogige ‘Dọra AkụnyiliWomen Development Center’, dị n’Awka, bụ nke a chịkọbàrà site na njikọaka òtùndị ntorobịa a mààrà dịka ‘United Anambra Youth Assembly (U-AYA)’ na otu jikọtaraụmụnwaanyị, bụ ‘United Anambra Women Assembly (U-AWA)’.   O tòrò ndị ntorobịana ụmụnwaanyị steeti ahụ maka ezi agbambọ ha nà nkwàdo ha na-enye ọchịchị ya, bụnke mere o jiri nweta mmeri n’okpuru ọchịchị ime obodo iri abụọ na otu e nwèrèna steeti ahụ, ọbụnadị dịka o kwupụtara na ọchịchị nwèrè ọtụtụ atụmàtụ dị icheiche ọ na-atụpụta maka ndị ntorobịa na ụmụakwụkwọ steeti ahụ.   Gọvanọ Obianọ, onyekwupụtàrà na isi òbòdo mba Austria bụ Vienna enyela ndị ntorobịa Anambra ruruiri ise n’ọnụọgụgụ ohèrè agụmakwụkwọ n’e