Posts

Showing posts with the label Ndị Igboukwu

Ndị Igboukwu enweela ọgbakọ ekpere, hanye obodo ha n'aka Chineke

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Igboukwu dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Agụata, na steeti Anambra, chịkọbara ọgbakọ ekpere pụrụ ichè, chee obodo ahụ n’ihu Chineke ma kpọkuo Ya ka O mepeere ha ụzọ.   Mmemme ọgbakọ ekpere ahụ, nke bụ nke mbụ obodo ahụ na-achịkọba ụdị ọgbakọ ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu ụlọụka ‘St. Paul’s Central School’ dị n’Igboukwu, n’okpuru ọchịchị Agụata, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ na ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu, nke gụnyere ndị ọrụ ụka, ndị sitere ụlọụka dị iche iche ndị ọchịchị obodo, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu.   N’okwuchukwu ya n’ebe ahụ, onyeozi Chineke siri Steeti Rivers wee bịa, bụ Ụkọchukwu Elkanah Hason kọwara ya bụ ọgbakọ ekpere dịka nke nwere ikike itiji agbụ niile nke ekwensu, weta ntọpụ n’agbụ ma wetekwa ngọzị na mmepe ụzọ n’obodo ahụ n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche.   O kelere ụmụafọ obodo ahụ maka ịghọta mkpa ọ dị iwedà onwe ha ala ma chọọ ihu Chineke site n’ọgbakọ ekpere ahụ, ọbụlad