Posts

Showing posts with the label Ndị Ajadu

E meela emume icheta ụbọchị ndị ajadu

Image
OTU ụmụnwaanyị ajadu a kpọrọ Virtuous Widows Association ofNigeria emmela ọgbakọ iji cheta ụbọchị ndị ajadu (International Womens Day),nke afọ a bụ 2020.   Ọ bụ n’ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation, Awka bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọNational Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Extra ka ha nọrọ wee mee ya.   N’ozi nnabata ya,onyeisi otu ahụ ma bụrụ onye hibere ya, Oriakụ Ifeyinwa Egbosiuba kwuru na ụbọchịahụ bụ nke mba ụwa (United Nations) wepụtara maka icheta ndị ajadu.   Egbosionu onye kwuruna nsogbu korona metụtara ndị ajadu n’ụzọ dị iche iche kelere gọọmenti ma rịọkwaamaka enyemaka nke dị n’ihu.   Ọ gara n’ihu kọwaana e hibere otu ahụ maka imetụta ndụ ndị ajadu dịka ha na-ebu ibu ịzụ ụmụ ha.Okwuputakwara na ọ na-adụ ha ọdụ oge niile ka ha kpachara anya n’ụdị agwa hana-akpa.   Nwunye aka na-achịsteeti Anambra bụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano, onye nke Oriakụ Michelle Onugbolunọchitere anya ya kelere Oriakụ Egbosiuba maka ihibe otu ndị ajadu bụ ndịsonyeere ndị otu ha na mb

Ajadu ọbụna ga-eke ajị n'ume

Chinwendu Uzoatu   MBA ụwa ewepụtana ụbọchị Satọdee na-abịa abịa, ọnwa a bụ ọnwa June ga-adị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na atọ dịka ụbọchị ndị ajadu, bekee kpọrọ ‘International Widows Day’.   Nke a pụtara na nwanyị ọbụna di ya nwụrụ anwụ aghọọna ajadu, ma nwata ma agadi. N’oge gboo, ọtụtụ ndị ajadu tara ahụhụ dị iche iche n’aka ndị be di ha. Ụfọdụ ka a naara ihe ha n’ike dịka ala, ụlọ na ihe nketa dị iche iche. O nwekwara ndị e gburu egbu. N’oge ahụ, ajadu na-adị ka ọ bụ onye a bụrụ ọnụ, onye ụwa jụrụ ajụ. Ọtụtụ ndị ajadu bụ ndị ụmụnwoke jiri aka ike na-esogbu ha ma na-akwa ha iko na mmegide n’ihi na ha enweghị ọnụ okwu. Nke a mere ka ọtụtụ ndị ajadu mụọ ụmụ karịa ole ha kwesiri ịmụ. Ụfọdụ ndị na-ekwetaghị ụdị mmekọ dị otu a na-anata ntaramahụhụ dị egwu n’ihi na a si na onye kweta ihe Onicha kwuru, ọ laa n’oge. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ n’oge gboo, maka ọ jụrụ ịnabata nwoke ọbụna dịka enyi, ma zụkwaa ụmụ ya n’ụzọ nke Chineke ka ha jiri bochie ya ọnụ wee si na ọ bụ osu. Ha boro ya e