Ndị ọlụ ugbo ebee akwa maka mkpamkpa oke ide mmiri
OKE iji mmiri nke gbara n’afọ a, ewerela ebe ndị mmadụ bi na ebe a na-akọ ọlụ ubi,mebie akụ na ụba nke a na pụghị ikwu ọnụ ahịa ya . Ndị ihe ndịa kasi njọ bụ ndị ọlụ ugbo na ndị bị nso na akụkụ osimiri Niger na osimiri Benue na Nigeria. Ihe butere oke iji mmiri nke a bụ na mmiri gafere akụkụ osimiri abụọ ahụ wee kwonye n’ebe ndị mmadụ bi na n’ebe a na-akọ ọlụ, wee mebie akụ na ụba obodo. Otu mmiri siri wee rie obodo ndị bị n’akụkụ osimiri, ụlọ dị n’ime ha, bụ oke ihe ịtụ n’anya n’ihi na e jisike ahụ ụlọ ụfọdụ anya. Ihe nile nke dị n’ime ụlọ ndị a abugoro ihe mebiri emebi. Ihe nile eji ebi n’ụlọ dịka akwa, ite, oche na nri dị iche dị n’ime ụlọ ahụ emebiela, o wee bụrụ oke ihe ọghọm n’ebe obodo ndị a na ezinaụlọ dị n’ime ha. Na steeti anyị bụ Anambra, gọọmentị ime obodo o metụtara bụ Ogbaru, Anambra West, Anambra East, Onitsha North, Onitsha South, Ayamelum na Awka North. Obodo nile nke dị n’ime Anambra West abụgoro ihe mmiri tochiri nke mere na gọọmentị etiti zitere osote onye isi ala N