Posts

Showing posts with the label National Youth Games 2021

National Youth Games 2021 ga-eme n'Oktoba

MINISTRỊ na-ahụ maka ndịntorobịa na ịkwalite egwuregwu (Ministry of Youth and Sports Development) n’ala anyị ekwuputala na a ga-eme emume egwuregwu omenafọ nke afọ a, 2021 National Youth Games (NYG) n’Ilorin, n’ọnwa Ọktoba.   Bode Durotoye bụ ‘Director Grassroots Sports Development’ na ministri ahụ kwuputara nke ahụ n’Abuja. O kwuru na deeti ọhụrụ a bụ n’ihi nhazi a hazigharịrị usoro agụmakwụkwọ (academic calendar) nke mahadum ebe e ga-anọ mee ya bụ University of Ilorin.   Durotoye kwuru sị: “Site n’amara Chineke, a ga-eme NYG n’Ọktoba. Nke a bụ n’ihi mgbenwe e nwere n’usoro agụmakwụkwọ nke mere na anyị kpebiri ịhazigharị ọnọdụ nke anyị. Nkwado ka na-aga n’ihu iji mee ka emume nke afọ a gara nke ọma. NYG bụ ebe e si ahọpụta ọnatarachi n’oge, n’egwuregwu dị iche iche ma kwalite ha.”