Posts

Showing posts with the label National Light

Otu edemede nkwado ndị agba ọfụụ akpokuola National Light maka nkwado

OTU a kpọrọ Africa/Street Anthem Poetry Team, Awka awụchaala n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Ta na SportsLight Xtra ka ọnwa Novemba dị n’abalị ise, n’afọ a bụ 2020 maka ijikọ aka na mmemme ha na-akwadebe, nke a kpọrọ ‘African Sensation II’.   Ha kọwara ebumnuche na ihe ha na-eme nke gụnyere abụ (poetry), tinyere atụmatụ dị iche iche ha nwere ma rịọ usoro ha kwesịrị ịgbaso iji mee ka mbọ ha na-agba mịta mmịmị.   Ha kwukwara aha ụfodụ ndị ha kpọrọ gụnyere Chukwunenye Amara Tamah na ọtụtụ ndị ọzọ aha ha na-ada ụda.   Ya bụ oke mmemme ga-ewere ọnọdụ ụbọchị ụka ọnwa Disemba ga-adị n’abalị isii, n’afọ a bụ 2020, n’ụlọ oriri na ọńụńụ Geneva Hotel, Okpuno nke dị n’okpuru ọchịchị Awka South.   Nwagboso Kosisochukwu kwuru sị na ha agaghị enwetacha ihe ha tụrụ anya ma ọ bụrụ na ha achọghị njikọ aka. O kelekwara ekele banyere nkwado ụlọọrụ ahụ nyere ha n’afọ gara aga.   O kwuru sị: “Anyị chọrọ mgbasaozi tupu anyị e

Ụlọọrụ tekninụzụ agba ọhụrụ achọọla mmekọrịta ya na National Light

GREAT Phones Enterprise, bụ ụlọọrụ teknọlọjii dị na Nnewiewepụtala akwụkwọ ọhụrụ ọ kpọrọ Afro Emoticons Colour Book maka ụmụaka na ọtụtụakọrọngwa ’emoticons’ iji nyere mgbasaozi aka.   Onye mere ka nke ahụpụta ihe bụ onye hibere otu ahụ Uchenna Nzewi, na mkparịtaụka ya na onyeisi ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) bụ Sir Chuka Nnabuife na ndịntaakụkọ National Light, mgbe ọ kpọtụụrụ ụlọọrụ ahụ.   Dịka o siri kwu, hamalitere ya bụ njem n’afọ 2014, na ha agbaala mbọ dị iche iche iji kwalitemgbasaozi n’Africa. Ọ rụtụrụ aka na ọ gbatara ya n’uche na mmalite afọ a,iwebata ụdịrị ’emoticons’ ọhụrụ, nke mere ya jiri wepụta akwụkwọ ‘colouringbook’ maka ụmụaka, nke na-egosipụta ’emoticons’ Africa.   Nzewi kọwara na akwụkwọahụ ka bụ obere ihe n’ihe ndị ụlọọrụ ahụ kwadoro maka ụmụ na-eto eto, dịka a kaga-achịkọba ‘Tech book camps’ tinyere onyoonyoo ‘educational video games’.   Ọ gara n’ihu kwuo naihe iche aka mgba ụlọọrụ ahụ nwere kachanụ bụ nsogbu korona nke mere na ọ dịghịzị

Ikwu na ibe ekeleela Chineke ka Nnabuife gbara afọ ọhụrụ

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taana Sportslight Xtra dịka onyeisi (Managing Director/Chief Executive Officer)Sir Chuka Nnabuife mere emume ọgbụgba afọ ya.   Emume ahụ kpọkọtara ọtụtụndị mmadụ sị n’ugwu na ndịda wee bịa soro ya ńụrịa n’ihi ngozi Chineke n’ebe ọnọ.   Sir Nnabuife, onyegbara afọ iri ise na abụọ (52) kelere Chineke maka ndụ na afọ ọma ya ma kpọkuondị mmadụ ka ha na-enye Chineke ekele oge niile.   O kwuru sị: “Ụfọdụ mmadụka anyị ike ma ha ahụghị ihu anyanwụ. Ọbịbịa m bịara ebe a bụ ngọzị, dịka mrugoro ọrụ na mpaghara South West ma rụkwaa ọrụ ntaakụkọ ọtụtụ afọ. Ọtụtụ ndịmmadụ kwuru na ebe a bụ ebe a gbahapụrụ agbahapụ ma kwuo ụdịrị okwu na-ajụ obioyi ma ana m eto Chineke taa maka ịnọnyere anyị.”   Odeakwụkwọ otu ndịntaakụkọ (NUJ) ngalaba steeti Anambra bụ Emma Udeagha toro Nnabuife maka mbọ yama rịọ Chineke ka o nyewanye ya amamihe iji na-aga n’ihu.   Onye enyemaka pụrụich

Na National Light, Onwubiko ebuputala akwụkwọ o dere ọhụrụ

onye na-anọchite anya Idemmili ‘North’ na ‘South’ n’ụlọ nzukọ omebe iwu dị n’Abuja. Onye nọchitere anya Ọkammụta C.C Esimone bụ onyeisi ụlọakwụkwọ ‘Nnamdi Azikiwe University Awka’ bụ Maazị Ojukwu kwere nkwa na ha ga-ahụ na ngalaba dị iche iche n’ụlọakwụkwọ ahụ ga na-agụ ya. ‘Sir’ Chuka Nnabuife, onyeisi ụlọọlụ ANPC kwuru si, “Onye dere akwụkwọ a bụ onye nke anyị. Isiokwu akwụkwọ ya bụ ụkwa a chị n’aka ma n’ala Nigeria ma na mba ndị ọzọ dịka Spain, US, Sudan, South Africa wdg; mana na Nigeria, ọ na-ere ọkụ. O gosiri na ọ ma ihe iche aka mgba dịịrị ala Nigeria. O meela ihe onye nta akụkọ kwesịrị ime.” Ndị si Oraeri, obodo Onwubiko kelere Chineke maka Onwubiko bụ nwanna ha. Onyeisi ha kwuru si na akwụkwọ ahụ na-aga na mmepe obodo Nigeria. Ọ kpọkuru ndị mmadụ ka a kwado ya. Onye ọkaikpe bụ Peter-Maximus Onunkwo kwadokwara ihe a na-eme ma dụọ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-agụ akwụkọ. Onunkwo kwuputakwara na ‘John Bosco Onunkwo Foundation’ kwụ chim chim maka ịkwado ya bụ akwụkwọ. Timonty Nwachukwu,