NYSC etòóla Obianọ maka nkwàdo ọ na-enye ndị ji otu ahọ éfè ala nna ha
ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka ndị ji otu ahọ efe àlà Nigeria, bụ ụlọọrụ‘National Youth Service Corp (NYSC)’ etòóla aka na-achị steeti Anambra, bụ GọvanọWillie Obianọ maka ezi nkwàdo dị iche iche ọchịchị ya na-enye ụlọọrụ ahụ nasteeti ahụ. Otuto a bụ nke ekwupụtara site n’ọnụ onyeisi ụlọọrụ NYSC n’ime steeti Anambra, bụ Maazị KehindeAremu, n’okwu ya oge ọ gara njem mkpọtụrụ na nke Ọkammụta Theresa Obiekezie, bụKọmishọna na-ahụ maka nkwàdo ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe e ji aka emepụtana steeti ahụ, n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka. Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụezi ọrụ dị iche iche gọọmenti steeti ahụ rụụrụ ụlọọrụ ahụ, ya na ụzọ dị icheiche o sigoro kwàdo ya bụ ụlọọrụ nà ndị ahụ ji otu ahọ efe ala nna ha na steetiahụ, iji mee ka ọnọdụ kawanyere ha mma. Dịka o siri kọwaa,nke kacha nke n’ime ihe ndị ahụ Gọvanọ megasịịrị ụlọọrụ ahụ n’ọdịnso a bụ nrụchaahụ ọ rụchapụrụ ògìgè ebe ahụ a na-anọ enye ndị ji otu ahọ efe ala nna ha ọzụzụn’ime steeti ahụ, bụ nke a rụrụ n’Ụmụawụlụ, dị n’okpuru ọchịchị ‘Awka South’.