A nwụchiela onye NYSC, ndị ọzọ maka ‘Yahoo Yahoo’ na Kogi
ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ anwụchiela mmadụ iri na iteghete a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro site n’usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ịntaneetị, bụ ndị a maara dịka ndị ‘Yahoo Yahoo’. Dịka ozi a kụpụrụ na nsonso a site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ EFCC, bụ Maazị Wilson Uwujaren siri kọwaa, otu onye n’ime mmadụ iri na iteghete ahụ e jidere bụ nwokorobịa ji otu ahọ efe ala nna ya n’okpuru usoro atụmatụ ‘National Youths Service Corps (NYSC)’ na steeti Kogi, bụ Adamu Shuaibu, tinyere mmadụ iri na asatọ ndị ọzọ. Maazị Uwujaren mèkwàrà ka a mara na ọ bụ na Lokoja bụ isi obodo steeti ahụ ka a nwụchiri ndị ahụ dịka e nwètèrè ozi banyere ebe dị icheiche ha nọ na ihe nọkwa ebe ahụ eme.\Dịka o siri kwu, mmadụ iri na asatọ ndị ọzọ gụnyere: Nelson Ojonoka, Victor Atsumbe, Akoh Grace Samuel, Usman Abubakar Sadiq, Jacob Emmanuel, Solomon John, Christ