Ọkaokwu ụlọ omeiwu Anambra arụọrọla ndị NUT ụlọọrụ ọhụrụ n'Ayamelum
OKAOKWU ụlọ ọgbakọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor arụọrọla òtù ahụ jikọtara ndị nkụzi bụ ‘Nigeria Union of Teachers (NUT)’, ngalaba nke okpuruọchịchị Ayamelụm isi ụlọọrụ ọhụrụ. Ya bụ ọmarịcha ụlọọrụ bụ nke a rụrụ n’obodo Anakụ, ma bụrụkwa nke e mere mmemme mgbape ya na nsonso a, bụkwa ebe Ọkaokwu ahụ nọrọ wee nyefèé ndị òtù ahụ igodo ụlọọrụ ahụ. N’okwu ya n’ebe ahụ oge ọ na-enye ndị òtù ahụ igodo ụlọ ahụ, Maazị Okafor kọwara nke ahụ dịka mmezupụta nkwà o kwere ha; ọbụladị dịka o kelekwara aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka iwetè ihe e jiri wee rụọ ya bụ ụlọ. O chètèèrè ndị bịara mmemme ahụ na Gọvanọ Obianọ atụnyela ụtụ dị ukwuu ma mekwa ọtụtụ ihe dara ụda n’ịkwalite ngalaba mmụta na agụmakwụkwọ steeti ahụ, bụkwa nke pụtara ihè n’etu ụmụakwụkwọ steeti ahụ sizị eme nke ọma ma na-enwetekwa mmeri dara ụda n’ule na asọmpi dị icheiche, ma n’ala Nigeria na n’ogoogo mba ụwa. N’okwu ya n’aha ndị otu ya, onyeisioche òtù NUT n’ime steeti Anambra, bụ M