Ndị isi NUPPPPROW emeela njem nleta n’ANPC
… Ndị isi, Obiano maka imeta ndịọrụ nkeọma A KỌWAALA steeti Anambra dịka obodo na-atọ ezi ụkpụrụ nke ndịọzọ na-elegara anya, n’ihe gbasara mgbasaozi, ọdịmma ndị ọrụ na ịrụpụta ezi ọrụ. Onyeisioche otuNational Union of Printing, Publishing and Paper Products Workers (NUPPPPROW)n’ala anyị, Comrade John Ushie kwuputara nke a n’Awka, isiobodo Anambra oge odu ụfọdụ ndị otu ahụ wee wụchaa n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation (ANPC). N’okwu ya na mmemmeahụ, o kelere Gọvanọ Willie Obiano maka imeta ndị ọrụ nke ọma tinyere mbọ ya n’ịkwụchapuụgwọ niile ruuru ndị lara ezumike nka n’ọrụ na steeti ahụ; ma kelekwaa ndịisiANPC n’ihi ime nke ọma maka ọdị mma ndị ọrụ. Dịka ọ na-akọwapụtamkpa ezi mmekọrịta dị n’etiti ndịisi maka imepụta ihe n’ụlọọrụ ọbụla, onyeisiNUPPPPROW ahụ, onye nke e dugharịrị n’ogige ANPC gosịrị afọ ojuju banyere ọnọdụụlọọrụ ahụ na ezi mmekọrịta dị n’etiti ndịisi na ndịọrụ ma kpọọ oku ka ọ dịrịotu ahụ na-aga n’ihu. Banyere ihe o ji bịanjem ahụ, o kwuru sị: “