Posts

Showing posts with the label NULGE

NULGE etoola Obiora-Ibezim maka ọrụ ọma, nye ya onyinye nkwanye ugwu

NDỊ otu Nigeria Union of Local Government Employees (NULGE), ngalaba steeti Anambra nọ n’izuụka gara aga mee emume nke a kpọrọ NULGE week/welfare day ma nyekwa ọtụtụ ndị mmadụ onyinye nkwanye ugwu ‘Awards’.   Onyeisi NULGE na steeti Anambra bụ Comrade Chikwelu Adigwe kelere mmadụ niile maka mbọ ha n’ịhụ na emume ahụ gara nke ọma. O kwuru na ọ bụ ihe oke ọńụ na NULGE nọkọtakwara ọnụ mee emume ha ka ọ gachara ihe karịrị afọ iri.   N’ozi ya nke ọ gụpụtara n’obi gọọmenti okpuru ọchịchị Njikọka nke dị n’Abagana na Fraịdee ọnwa Novemba dị n’abalị iri na atọ, Adigwe kelere Chineke maka afọ ọma ya n’ebe ha nọ. Ọ kọwara na ọnọdụ ahụ bụ nke ndị NULGE ji anọkọrịta ma kpụọ onwe ha ọrụ.   O kelere aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano maka mbọ na ịhụnanya ya n’ebe ndị ọrụ nọ. O chefughị onyeisioche Local Government Service Commission, Dọkịnta Peter Egenti na ndị igwe kọmịshọna ndị ọzọ.   N’akụkụ nke ya, Dọkịnta Nwadiogbu N.M, onyeisioche okpuru ọchịchị ime obodo Oyi, bụ onyeisioche emu

Otu NULGE ekwuola na ọ ga-enye Obiora-Ibezim onyinye nkwanye ugwu echi

NNDỊ otu Nigeria Union of Local Government Employees (NULGE), ngalaba steeti Anambra ga-anọ ụbọchị Fraịdee ọnwa Novemba ga-adị n’abalị iri na atọ wee nye otu odoegwu nwaanyị maara ihe ekwe na-akụ n’ọrụ onyinye nkwanye ugwu ‘award’.   Onye a na-ekwu maka ya bụ Oriakụ Gloria Obiora-Ibezim, odeakwụkwọ ma bụrụ onyeisioche (Secrteary/Chief Executive) Local Government Staff Pension Board, Awka. Ozi ahụ, tinyere ihe ndị ọzọ kwuru sị: “NULGE, ngalaba steeti Anambra nọ kemgbe na-eleru anya n’ụzọ niile i si arụ ọrụ gị n’obi ọma, na ụtụ ị na-atụnye maka ọdị mma ndị mmadụ nọ n’akụkụ gị, tinyere ọrụ gị n’ebe Chineke na mmadụ nọ, ihe niile ị na-eme pụrụ iche na mbọ gị n’idozi (reforming) ụlọọrụ Local Government Staff Pension Board, Awka wee kpebie iji ‘NULGE Platinum Service Award’ wee kwanyere gị ugwu, iji wee gbaa gị ume.”   Nnukwu mmemme a ga-ewere ọnọdụ na Njikọka Local Government Headquarters, Abagana, n’elekere iri na abụọ etiti ehihie (12:noon) kpọmkwem.