Winnie Mandela bụ odogwu nwanyị - 'NLC'
OTU’ Nigerian Labour Congress (NLC)’ akọwaala ọnwụ Winnie Madikizela Mandela bụ onye so n’onye mbụ gbara mbọ maka nwere onwe nke South Africa dịka ndụ nke jupụtara n’ịgba mbọ. Onye isi oche NLC, Ayuba Wabba, kwuru na ndị otu ha na Nigeria e sonyerela ndị ọdịka ọ dị ha na mba ụwa n’iru uju ọnwụ odogwu nwanyị Africa a. O kwuru si ‘ọ bụ eziokwu na ọnwụ Winnie wutere anyị, otu’Nigerian Labour Movement’ nwekwara ihe anyi ga-eji too ndụ ya nke jupụtara n’ịgba mbọ, ịchụ aja na ịgbara ndị mmadụ odibo, dịka o si dị na ndụ Mama Winnie.’ Winnie Mandela bụ onye nwụrụ ka ọnwa ‘April’ dị na mkpụrụ ụbọchị abụọ. Wabba gara n’ihu kwuo, ‘ka ọtụtụ ndị mmadụ, nde kwuru nde si nọrọ na nwute na South Africa, mba ụwa dị iche iche gosipụtara ezi mbọ nke onye ahụ ndị South Africa ji ihunanya na-akpọ ‘Mama’. Ọ gakwara n’ihi kwuo na ọ hịara ahụ ịkọwapụtacha ọlụ ọma, ịchụ aja nke Winnie Mandela maka ịgbapụta mba ahụ. Ọ kọwakwara na Winnie Mandela gbara mbọ pụrụ iche ma dịkwa egwu dịka onye hụrụ ndị nke ya n’any