Posts

Showing posts with the label NILOWV

N'Anambra, òtù NILOWV emeela ọgbakọ nkuzi ome n'afọ ma nye ụmụakwụkwọ nkwado

NDỊ òtù League of Women Voters of Nigeria (NILOWV), ngalaba steeti Anambra emeela ọgbakọ nkuzi ome n’afọ ha tinyere amùmà nkwado (annual seminar/empowerment programme). Ọ bụ n’ụbọchị onye kwuo uche ya (Democracy Day) nke afọ a, Septemba 15, 2021 ka ha mere ya.   Emume ahụ nke weere ọnọdụ n’Ekwulobia dị n’okpuru ọchịchị Aguata kpọtụrụ akpọtụ ma bụrụ nke ụmụnwaanyị ji obi ha niile were nabata. A kọwara ma kuziere ha ụzọ ha ga-esi tụọ okwe nhọpụta ọchịchị, na ọrụ ha nwere ịrụ dịka nne n’oge a na Nigeria ma kwụọrọ ụmụaka koleeji ndị onweghị ka ọ ha, ụgwọ akwụkwọ.   N’ozi ekele nnabata ya, onyeisi òtù ahụ, Dọkịnta Cordelia Ego Uzoezie gbakwasara ụkwụ n’isiokwu ncheta ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya nke afọ a, nke bụ; ọchịchị onye kwuo uche ya: Isi sekpụ ntị maka udo idịgide na Nigeria (Democrary: An Engine for Sustainable Peace in Nigeria). O kwuru na ọchịchị onye kwuo uche ya na-eweta udo na ọganihu; na iji mee ka ọ dị otu ahụ, mmadụ niile kwesịrị ijikọta aka ọnụ maka na a nyụkọọ mamịrị ọ