Posts

Showing posts with the label NECO

Ihe ụfọdụ mmadụ kwesịrị ịmata banyere Obioma, Onyeisi NECO, lara mmụọ

OBIOMA bụ onye okpuru ọchịchị Bende na steeti Abia. 2.            N’afọ 1993, a họpụtara Obioma dịka ọkammụta ‘Mathematics Education and Evaluation’ na mahadum University of Jos, ebe ọ nọ wee gbagoo n’ọkwa Onyeisi Ngalaba ahụ ‘Head of Department’ n’afọ 1993. 3. Site n’afọ 1994 ruo 2000, Obioma rụrụ ọrụ dịka Onyeisi (Director), Monitoring and Evaluation na National Primary Education Commission, Kaduna. 4. Ọ rụrụ ọrụ dịka Onyeisi (Director) Monitoring, Research and Statistics n’ụlọọrụ National Board for Technical Education, Benin City, site n’afọ 2003 ruo 2005. 5.Site na 2005, ọ rụrụ ọrụ (two terms) dịka Odeakwụkwọ, Nigerian Educational Research and Development Council, Abuja. 6. Ọ bụ ya ka ọ dị n’aka na nhọpụta ọkwa ọchịchị (former Resident Electoral Commissioner), nke steeti Ebonyi. 7. Na Mee 14, 2020, Onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara Obioma dịka Onyeisi (Registrar NECO), maka afọ isii.

NECO ewepụtala oge ọzọ a ga-ele ule 2020 SSCE e yigharịrị na mbụ

ULỌỌRỤ National Examination Council (NECO) ewepụtala oge ọzọ a ga-elezi ule 2020 Senior Secondary School Examinations (SSCE) ‘external’, nke e yigharịrị na mbụ.   Ụlọọrụ ahụ ndị dị na mbụ tinye ule ahụ na Monde Febrụwarị 1 wee ruo na Wenezdee Februwarị 3 eyigharịala ya ka ọ dịbazie n’agbata Monde, Febrụwarị 8 wee ruo Wenezdee, Maach 10, 2021.   Otu na-ahụ maka ule ahụ, na Minna site n’aka onyeisi mgbasaozi ha, Mallam Azeez Sani, gwara ndị ga-ele ule ahụ bụ ndị eleleghị ụfọdụ ule ha kwesịrị ile n’oge 2020 SSCE (internal) n’ihi ngagharị #EndSARS n’ụfọdụ steeti ka ha gbasoro oge ndị a e wepụtara ọhụrụ (new dates) ma bịa maka ule n’ebe ndị ha kwesịrị ịnọ lee ya.   Ọ gara n’ihu kpọkuo ha ka ha gaa na ‘website’ kansụl ahụ hụ oge na otu e si hazie ule ahụ (revised examination time table).   Onye ji ọkwa dịka ‘Registrar na Chief Executive Officer’ bụ Ọkammụta Godswill Obioma nọ n’oge e wepụtara ule 2020 SSCE (internal) wee kwuo na kansụl ahụ emeela nhazi pụrụ iche maka ndị niile eleghị ule (in

A ga-amalitekwa ule NECO na Monde

ỤLỌỌRỤ National Examination Council (NECO) ekwuputala na ule 2020 Senior Certificate Examination (SSCE) nke a kwụsịrị n’ala anyị n’ihi ọgbaghara EndSARS ga-amalitekwa na Monde izuụka ọzọ, ọnwa Novemba ga-adị n’abalị iteghete.   Okwupụta okwu NECO bụ Azeez Sani n’ozi ya n’Abuja kọwara na a ga-amalitejwa ule n’ihi na steeti niile tinyere FCT adaala jụụ dịka e nwechara nsogbu ndị ahụ dapụtara ka a na-eme nagharị EndSARS.   Ka anyị cheta na NECO yigharịrị ule 2020 SSCE abalị olemole gara aga n’ihi ọgbaghara dapụtara n’ala anyị nke mere na ha enweghịzịkwa ike ikesa ihe e ji ele ule, tinyere ileta ka ule ahụ si aga.   Otu o sila dị, ụlọọrụ ahụ kelere ụmụ Nigeria na ndị na-ele ule ahụ maka ndidi na nghọta ha nwere oge ahụ e yigharịrị ya bụ ule.   Ya mere, o kwere ọha na eze nkwa ezi ọrụ oge niile.

Ụlọọrụ NECO eyigharịala ule n'ihi ngaghariwe #EndSARS

ỤLỌỌRỤ National Examination Council (NECO) eyigharịala ule n’ihi otu ihe siri gbata kwụrụ n’ala anyị maka ngaghariwe #EndSARS. Ndị na-ahụ maka ụlọọrụ ahụ (Governing Board) kpebiri nke a oge ha nọ nzukọ pụrụ iche n’izuụka gara aga. Kansụlụ ahụ n’ozi ha ka ọnwa Oktoba dị n’abalị iri abụọ na otu, n’afọ a bụ 2020, gwara ọha na eze na ha eyigharịala ụfọdụ ule ahụ na-aga n’ihu n’ihi na ha enweghịzị ike ikesa ihe ndị e ji ele ule ahụ na steeti ụfọdụ n’ihi ọnọdụ onye apụtala iro (curfew). Mana site na nzukọ nke Tọzdee, ka ha kpebiziri ịkwụsị ule ahụ, ka ọ dịbazie n’ọdịnihu bụ mgbe amabeghị (indefinite) n’ihi ọnọdụ iche aka mgba banyere nchekwa (security challenges) n’ihi ngaghariwe #EndSARS, bụ nke ghasara ule ahụ na mpaghara ụfọdụ n’ala anyị. N’ozi ya ụbọchị ụka, onyeisi mgbasaozi (Head, Information and Public Relations Division) NECO, Azeez Sani kwuputara na ha mere mkpebi ahụ n’ezie. Na mkpebi ahụ, ha rụtụrụ aka na n’ihi iche aka mgba nchekwa, gọọmenti steeti ụfọdụ nyere iwu onye apụtala ir

A gaghị ele ule WAEC na NECO ganye na COVID-19 agafee – Goomenti Etiti

GOOMENTI Etiti ekwuputala na ụmụakwụkwo na-akwado maka ileule West Africa Examination Council (WAEC) na National Examination Council(NECO), ga-amata mgbe ha ga-ele ule ndị ahụ mgbe onodụ ịno n’ụlo (lockdown)gachara. Minista Steeti maka orụ n’ala anyị, Maazị ChukwuemekaNwajiuba kwuputara nke a ụbochị Tuzdee n’Abuja n’okwu o gwara ndị orụ gbanụgbanụ (Presidential Tasck Force) maka Covid-19. Dịka o siri kwu, e yigharịrị ule WAEC na NECO n’ihicoronavirus.Otu ahụ ka o kwukwara banyere National Open University (NOUN). Haga-amalitekwa ma e mechaa. O kwuru sị; “Anyị na Universal Basic Education na StateBasic Education Board na-arụko orụ, iji me ka o dị mfe. Steeti iri na ise nke gụnyereLagos na Anambra amalitela ihe omụmụ site n’igwe okwu redio n’usoro iwu sirikwu. Anyị na-emekwa ka NTA na Radio Nigeria sonyekwuo.” Ọ gara n’ihu kowaa na ha matara na ụfodụ ụmụaka enweghịakorongwa intaneeti, ya mere, o kwuru na ngalaba ahụ ga-ama ihe a ga-emebanyere nke ahụ; ma rụtụkwa aka na ụloakwụkwo dị elu g