Posts

Showing posts with the label NCTUA

NCTUA akpọọla òku maka njikọ aka gọọmenti steeti na etiti

BUUSU sị na ọ bụ mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne, maka na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbọọ ụfụfụ. N’ịgbaso nke a, nnukwu ọgbakọ otu ụbọchị nke ngalaba ụlọ ọrụ ‘National Cash Transfer Unit, Abuja’ ewerela ọnọdụ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee kpọọ òkù ka e nwee ezi mmekọrịta n’etiti gọọmenti etiti na nke steeti dịka o siri metụta ịkwàlite amụma ikesa ego maka nkwalite obibi ndụ, bụ nke a kpọrọ ‘Cash Transfee program’. Nnukwu ọgbakọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti dị n’Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị isi ọchịchị steeti ahụ, ndị isi oche okpuru ọchịchị dị iche iche, ndị minista sitere steeti ahụ, ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ. N’okwu mmàlite ya, onyeisi ngalaba ‘Conditional Cash Transfer Program’ n’ala anyị, bụ Dọkịta Temitọpe Sinkaịya kọwara ya bụ atụmatụ dịka otu n’ime amụmà nkwàlite obibi ndụ gọọmenti etiti ji n’aka ugbua, bụ nke o si na ya enyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ na ndị o nweghị