NCDC emepeela ogige nnyocha korona n'Anambra
ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka ọrịa na-efe ede, bụ ụlọọrụ ‘NigerianCentre for Disease Control, NCDC’ nọrọ na nso-nso a wee gbapee ògigè ebe ahụ aga na-enyocha ịma ndị bu ọrịa nje korona n’ime steeti Anambra. Ya bụ ogigè nnyochabụ nke a rụrụ n’ụlọ ahụ ike Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n’Awka bụisi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke a gbapere ma nye ikike ịmalite mebennyocha n’ụbọchị Mọnde isimbido izuụka a. Nkwàdo na ikike ịmaliteọrụ ahụ bụ nke e nwetàra site n’aka ụlọọrụ NCDC, ma bụrụkwa nke e nwetara oge gọọmentisteeti ahụ natachara akụrụngwa dị iche iche e ji arụ ọrụ maka ibuso ọrịa ahụagha. N’okwu ya banyerenke ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Okpalamere ka a mara na e jiri akụrụngwa ‘Abbot m2000’ (bụ akụrụngwa nwere ikike imennyocha iri iteghete na anọ otu ùgbòrò) wee kwàdo ya bụ ụlọọrụ ịmalite ọrụ. Dịka o siri kọwaa,otu n’ime akụrụngwa ahụ ga na-eme nnyòcha ruru narị anọ na asaa n’ime awà iriabụọ na anọ, nke pụtara na ha ise ga na-eme nnyo