Posts

Showing posts with the label NBC

NBC amàlitela ọrụ ịgbaziri Anambra na Enugu oke ala

IGBO sị na ọ na-abụ a kpaa akpaa, a rahụọ n’ute, ma sịkwa na ọ na-abụ a dị n’ìzù a nata ndị mmụọ ihe. Ụlọ ọrụ ahụ okwu bànyere oke ala dị n’aka n’ala Nigeria, bụ ‘National Boundary Commission (NBC)’ agbapeela amụmà ọrụ ịkpa ókè àlà anya ọzọ na nsogbu oke ala ahụ na-adapụta n’etiti ụfọdụ obodo steeti Anambra na steeeti Enugu, n’ebe steeti abụọ ahụ gbàrà agbataobi, iji hụ na e kpèzìrì ya ma mekwa ka ufo tọrọ àtọ laghachi. Mmemme ịgbape atụmatụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Ajalị bụ isi obodo okpuru ọchịchị Orumba North, ma bụrụkwa nke dọtara ndị ji ọkwa ọchịchị, ndị nnọchi anya òtù ahụ, nakwa ụmụafọ obodo ndị ahụ ya bụ nsogbu oke ala na-adapụta n’etiti ha; ma ndị Anambra, ma ndị Enugu. Okpuru ọchịchị ndị ahụ ya bụ nsogbu oke ala metụtàra gụnyèrè ‘Awka North’ na ‘Orumba North’ nke steeti Anambra, na Eziagu na ‘Oji-river’ nke steeti Enugu. N’okwu ya na mmemme ahụ, onye jigodi ọkwa dịka onyeisi ụlọ ọrụ NBC, bụ Maazị Adamu Adaji mere ka a mara mkpebi na ezi njikere ya bụ ụlọ ọrụ dị iwèta nsogbu ó