Posts

Showing posts with the label NAPTIP

Otu nwoke akpọfeela enyi ya nwaanyị Mali manye ya ka ọ gbaba ashawo

ỤLỌỌRỤ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons kwuru na ha anwụchikọọla otu nwoke aha ya bụ Emmanuel Stephen ka ọ na-akpọfe enyi ya nwaanyị gbara afọ iri abụọ na otu mba Mali maka ịgba ashawo.   Onye okwuputa okwu ụlọọrụ ahụ, Vincent Adekoya, kwuputara nke ahụ n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ n’Abuja na Monde.   Ozi ahụ kwuru na ya bụ nwoke, bụ onye Akoko na steeti Ondo ma biri na Karmajiji, Airport Road, Abuja.   O kwuru na ya na nwaanyị ahụ onye nke na-amụ ọrụ n’ebe a na-achọ mma n’Abuja nọ kemgbe afọ abụọ gara aga na-adị mma.   Oge a na-agba ya ajụjụ, nwoke ahụ kwuputara na nnukwu nwanne ya nwaanyị bi na Mali kpọrọ ya na mbido afọ ka a kpọtara ya nwata nwaanyị ga na-ejere ya ozi (menial job).   Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na nwoke ahụ meziri ma zipu enyi ya nwaanyị ahụ Mali n’ọnwa Epure, site n’enyemaka ‘trolley’ na Benin, steeti Edo.   O kwuru sị na ọ bụ eziokwu na nwoke ahụ aka kpaara kwere enyi ya nwaanyị nkwa na ọ bụ n’ụlọ mmanya ka ọ ga na-arụrụ nwanne ya nwaanyị

NAPTIP adọọla aka na ntị banyere alụmdi site n'ụzụ ihe ọyị social media

A DỌỌLA ndị ntorobịa aka na ntị ka ha kwụsị itinye onwe ha n’alumdi site n’ihe ọgbara ọhụrụ ọnyanwudude (social media).   Ọ bụ onyeisi The National Agency for the Prohibition of Trafficking in Person (NAPTIP) Oriakụ Julie Orkah-Donli kwuputara nke a oge o wụchara na Iruekpen Mixed Secondary School, Iruekpen; nke dị n’okpuru ọchịchị Esan na steeti Edo.   Orkan-Donli kwuru na ndị na-atụ mgbere mmadụ na-esite n’ụzọ alụmdi dị otu ahụ wee na-akpọpụ ụmụnwaanyị maka ịgba akwụnakwụna (ashawo). Ọ dụkwara ụmụakwụkwọ ọdụ ka  ha gbaara oke ịlụ di n’oge ọsọ, ọ kachasị mgbe he erubeghị afọ iri na asatọ; ma gwakwa ha mkpa ọ dị iji aka ha họrọ onye ha na ya ga-alụ di na nwunye.   Onyeisi NAPTIP ahụ gakwara n’ihu kwuo na ụzọ ndị ọzọ ndị ọjọọ ahụ sị enweta ndị ha ji atụ mgbere gụnyere ikwe nkwa ịbanye n’ịgba bọọl, iji onye ahụ gosi ihe dị mma dịka akwa (modeling), njem (pilgrimage). O kwuru na ọnọdụ iji mmadụ atụ mgbere na-ebute ọnwụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ma kwukwaa na ihe ndị na-akpata ya gụnyere ogbeny