Otu nwoke akpọfeela enyi ya nwaanyị Mali manye ya ka ọ gbaba ashawo
ỤLỌỌRỤ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons kwuru na ha anwụchikọọla otu nwoke aha ya bụ Emmanuel Stephen ka ọ na-akpọfe enyi ya nwaanyị gbara afọ iri abụọ na otu mba Mali maka ịgba ashawo. Onye okwuputa okwu ụlọọrụ ahụ, Vincent Adekoya, kwuputara nke ahụ n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ n’Abuja na Monde. Ozi ahụ kwuru na ya bụ nwoke, bụ onye Akoko na steeti Ondo ma biri na Karmajiji, Airport Road, Abuja. O kwuru na ya na nwaanyị ahụ onye nke na-amụ ọrụ n’ebe a na-achọ mma n’Abuja nọ kemgbe afọ abụọ gara aga na-adị mma. Oge a na-agba ya ajụjụ, nwoke ahụ kwuputara na nnukwu nwanne ya nwaanyị bi na Mali kpọrọ ya na mbido afọ ka a kpọtara ya nwata nwaanyị ga na-ejere ya ozi (menial job). Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na nwoke ahụ meziri ma zipu enyi ya nwaanyị ahụ Mali n’ọnwa Epure, site n’enyemaka ‘trolley’ na Benin, steeti Edo. O kwuru sị na ọ bụ eziokwu na nwoke ahụ aka kpaara kwere enyi ya nwaanyị nkwa na ọ bụ n’ụlọ mmanya ka ọ ga na-arụrụ nwanne ya nwaanyị