NAFDAC akatọọla ụfọdụ erimeri ụmụaka esiri US tụbata
ỤLỌỌRỤ na-ahụ maka erimeri na ọgwụ, nke akpọrọ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC), adọọla ndị Nigeria aka na ntị ka ha kwụsị ịńụ ma na ekesa erimeri ụmụaka (infant formulas) nke sitere n’aka Abel Group, bụ kọmpịnị sị mba U.S.A. Ozi si n’aka onyeisi zuzugbe (Director General) NAFDAC, Ọkammụta Moji Adeyeye gbara ama na ụlọọrụ ahụ enwetala ozi site n’aka US-FDA banyere ụfọdụ erimeri ụmụaka. Nri ụmụaka sitere n’aka kọmpịnị ahụ ka e kwuru na ha enweghị ‘iron’ zuru ezu tinyekwara na ha enwezughị usoro ihe ndị US Food and Drug Administration (US-FDA) guzobere. Adeyeye kwuru n’ihe ezughị oke erimeri ụmụaka ndị ahụ, na ọ ga-enye ụmụaka nsogbu dịka ọ kọwara na nwata anaghị erita ‘iron’ ole o kwesịrị nwere ike inweta ụkọ ọbara n’ahụ ya (anaemia). O kwuru sị: “NAFDAC na-akpọku ndị na-atụbata, ndị na-ekesa ma tinyere ndị na-eri eri (consumers), na ndị debere erimeri ụmụaka ndị a ka ha kwụsị ikesa na iri ya. NAFDAC na-agwa ndị mmadụ na-eri erimeri ndị a, ti