Posts

Showing posts with the label Mojisola Adeyeye

NAFDAC akagbuola iji kemikalụ akwado, echekwa ihe oriri

ỤLỌỌRỤ National Agency for Food, Drug Administration and Control (NAFDAC), akatọọla ma maa ọkwa na ọ dị nnukwu njọ bụ iji ihe ọjọọ ahụ mmadụ achọghị (chemicals and additives) esi ihe oriri na imebe mmanya.   Onyeisi (Director General), NAFDAC bụ Ọkammụta Mojisola Adeyeye kwuputara nke a n’ozi nke onye ntaakụkọ ha Sayo Akintola binyere aka na ya nke o kọwara na ụlọọrụ ahụ ga-ahụ na ọ bụ sọ ezi ihe oriri ka a ga na-ere n’ahịa.   Mmadụ atọ ka e kwuru na ha nwụrụ na Kano ka ha ṅụchara mmanya e tinyere kemikalụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ọrịa.   Otu o sila dị, Ọkammụta Adeyeye kwuru na ha enyela Gọvanọ steeti Kano bụ Dọkịnta Abdullahi Ganduje mpụtara nke mbụ ha nweterela n’oge njem abalị abụọ ha mere na steeti ahụ banyere ya bụ ọdachi. O gosiptara mwute o nwere banyere ndị ahụ nwụrụ anwụ, tinyere ndị nọ n’ọrịa. Ọ kọwara na a nwụchikọọla ndị ahụ na-ere kemikalụ ọjọọ ndị ahụ dịka nnyocha ka na-aga n’ihu.   Ọ gara n’ihụ kọwaa na ọ bụ eziokwu na ihe oriri dị mkpa na ndụ mmadụ mana mgbe ọbụla ihe ọ