Ndị uweojii anwụdela mmọnwụ maka ịda iwu
NDỊ uweojii Steeti Ogun anwụchikọọla otu mmọnwụ maka ịda iwugoomenti steeti ahụ tiri gbasara ọgbakọ otụtụ ndị mmadụ n’otu ebe nke so n’otu ụzọe si egbochi nkesa ọrịa ọjọọ Coronavirus. A nwụchikọrọ mmọnwụ ahụ oge ọ gakwuru ndị uweojii wee gwa hana ọ ga-emesi ha ike ma ha chụsaa ndị na-eso ya n’azụ (ụmụ nkwụ ya). Onyeokwuputa okwu ndị uweojii na Steeti ahụ, Abimbola Oyeyemi n’okwu ọ gwara ndinta akụkọ kwuru na ọ bụ ụbọchi ụka ka a nwụchikọrọ mmọnwụ ahu n’Ijeja dịn’Abeokuta site na mkpesa nke ndị mmadụ na igwe mmadu dị narị kwuru narị gbakọrọn’ebe ahụ. Oyeyemi kwuru na emume ahụ bụ maka ime emume mmọnwụ(masquerade festival) n’ebe ahụ. O kwuru na emume ahụ tinyere egwu ikesa ọrịacoronavirus n’obi ndi okirikiri ahụ. O kwuru si, “Dika e nwetara mkpesa, ndị uweojii nke IbaraDivisiọn gara ebe ahụ dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbasasịa; mana, mmọnwụ ahụwakporo ndị uweojii, ma kwuo na ya ga-emesi ha ike ma ha gaa n’ihu ichụsasị ndịna-eso ya. A nwụchikọrọ mmọnwụ ahu ozugbo ma kpọga ya n’ogige nd