Otu nwoke ejirila akaọdụ kugbuo nne na nna ya
NJINJI jiri na Mkporogwu, Iheakpu Awka, nke dị n’okpuru ọchịchịIgbo-Eze South na steeti Enugu, ka otu nwoke aha ya bụ Michael Ugwuanyị jiriakaọdụ (pestle) kụgbuo nne na nna ya. Ya bụ nwoke gbara afọiri anọ na ise ka e kwuru na ọ wakporo nne ya bụ Florence Ugwuanyị ebe ọ nọ n’ụsọekwuasụ akpụ ka mmiri na-ezo na mgbede Satọdee ahụ, napụ ya akaọdụ ahụ, were ya kụọya n’isi, ọ nwụọ. Ka o mechara nke ahụ,ọ wakpokwara nna ya, werekwa akaodụ ahụ kụkwa ya n’isi. Ozigbo, o weereekwenti nne ya kpọọ ikwu na ibe ya dịka o jiri akwa kechichaa ha isi, wee gwaha na ha riri agwa wee na-enwe nsogbu maka ya. N’ime ihe niile, ọ kọọrọgbagoo n’elu na ala, mana e mechaara hụ ozu nne na nna ya n’ụsọekwu n’echi yaebe ụbụrụ isi ha ghasara n’ala. Onye okwupụta okwu ndịuweojii steeti ahụ, Daniel Ndukwekwuru na a nwụchịkọọla nwoke ahụ dịka kọmishọna uweojii nyerela ntụzi aka ka ahafee okwu n’aka ndị na-ahụ maka arụ, State Criminal Investigation Department. Otu o sila dị,nwanne nwoke ahụ kpara arụ bụ Pius