Posts

Showing posts with the label Mkpụrụosisi

Mango: Mkpụrụosisi na-amasi mmadụ niile

MANGO so n’otu mkpụrụosisi na-amasi ọha na eze. Ọ na-atọ ụtọ ma na-ejukwa afọ.   N’oge gboo n’ala Igbo onweghị ihe dịka mango. Mkpụrụosisi dị n’oge ahụ bụ ube, ụdara, ugiri, ụtụ w.d.g. Nke a pụtara na mango si mba ọzọ were bata ala Igbo. Aha ya zipụtara nke a n’ihi na ọ naghị aza aha Igbo.   Kemgbe ahụ ọ batara onye ọbụla nabatara ya maka na ọ bụ ezigbo mkpụrụosisi.   Mango dị n’ụdị dị iche iche ma sikwa otu ahụ nwee mgbakwunye aha dịka ọpịọrọ mango, jaman mango, mango Igbo. Otu o sila dị, ha niile bụcha mango kama ha na-enwecha ndịiche.   Mango, dịka mkpuruosisi ndị ọzọ dị n’ụwa nwere oge o ji amị. Oge ahụ ruo, o bido ghaba ifuru, nke ahụ gachaa ọ mịa ma chakwaa. Ọ na-enye ndị mmadụ ọńụ ịhụ na mango achaala. Ụmụaka na anọ n’ukwu ya oge ọbụla ịchọ nke ha ga-ata.   N’ime afọ a ka ọ dị ugbu a, oge a bụ oge mango mana ọ kọrọ ụkọ n’ahịa ma na-agalakwa oke ọnụ nke na ọ bụghị onye ọbụla nwere ego igota ya. Nke a mere na ọtụtụ ndị mmadụ na-akwa arịrị na ha atabeghị mango ka ha siri chọ.   Otu