Bill Gates na nwunye ya ekwuola na ha ga-ekewa
… Ka ọ gachara afọ iri abụọ na asaa ha lụrụ di na nwunye AKA ji akụ a maara nke ọma n’ụwa niile gbaa gburu gburu ‘Tech-multi-billonaire’ bụ Bill Gates na nwunye ya, Melinda ekpebiela ịgba alụkwaghị m, ka ọ gachara afọ iri abụọ na asaa ha lụrụ di na nwunye. Otu o sila dị, ha kwuputara na ha ga-aga n’ihu n’ọrụ enyemaka ha na-enye ndị mmadụ nke ha jikọtara aka ọnụ hibe, a kpọrọ Bill and Melinda Gates Foundation mana ha agaghị abụzi dinanwunye. N’ozi ahụ nke ha kụpụrụ site na nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ twita, ha kwuru sị: “Ka anyị leruchara anya banyere ọnọdụ mmekọrịta anyị; anyị mere mkpebi ịkwụsị alụmdinanwunye anyị. N’ime afọ iri abụọ na asaa gara aga, anyị azụpụtala ụmụ atọ gbasiri ike ma hibe ‘foundation’ nke na-arụ ọrụ ụwa niile iji mee ka mmadụ niile na-ebi ndị n’ezi ahụike na ịgba mbọ. Anyị ga na-aga n’ihu na nkwenye anyị kwenyere banyere nke ahụ, mana anyị ekwenyezighị na anyị ga-etokota ọnụ dịka dinanwunye na mpaghara ndụ anyị na-abịa.” Akwụkwọ akụkọ ‘Forbes Magazine’ gụn