Mbido akwụkwọ na ihe so ya
ABALỊ iri nke atọ n’ọnwa a ka ụmụakwụkwọ steeti Anambra bidoro akwụkwọ nke afọ a bụ 2021. Ezinaụlọ ọbụla ka nwere ụmụaka nọ na ntakara, primarị na sekọndịrị na-agba mbọ otu ha ga-esi kwado ụmụ ha nke ọma n’ibido akwụkwọ a. Nke a gunyere ndị nọ n’obodo mepere emepe na ndị nọ n’ime obodo. Nke a meziri na ị gaa n’ahịa ugbua, ịbaa ebe a na-ere akwụkwọ, akpụkpụ ụkwụ, akwa akwụkwọ, efere e ji ebu nri aga akwụkwọ na ihe e ji ebu mmiri ọñụñụ, ị gaghị ahụ ụzọ maka na ọtụtụ ndị na- ego ihe ndị a. Otu aka ahụ, ị gaa ebe a na-akpa isi, ị ga ahụkwa ka ụmụaka jupụtara ebe ahụ. Ị baa n’ụlọakwụkwọ nile ugbua, ị ga ahụkwa ọtụtụ ụmụaka ka ha juru ma ndị nke na-ebido ọhụrụ ma ndị nke chọrọ ịgbanwe ụlọakwụkwọ. Oge a bụkwa oge ndị nkuzi ji enwe ọlụ. Otu nwanyị n’ere ahịa na UNIZIK ochie, aha ya bụ Adaeze Udoji kwuru ihe ndịa maka mbido akwụkwọ a: Na mbụ, ọ sịrị na obi dị ya ụtọ n’ihi na oge a, ahịa na-aga nke ọma. Nwanyị a bụkwa onye na ere akpa akwụkwọ, akpụkpụ ụkwụ, akwa ụmụakwụkwọ na-eyi n’ime nakwa