Posts

Showing posts with the label Mba China

China achọọla nkwàlite mmekọrịta ya na Anambra

GỌỌMENTI mba China ekwuputala ma gosipụta njikere ya ịkwalite ezi mmekọrịta ahụ dị n’etiti ya na steeti Anambra n’ihe gbasaara nkwàlite mmepe obodo, na azụmahịa. Onye nnọchite anya mba ahụ n’ala Nigeria, bụ Maazị Zou Pingjian kwupùtara njikere a oge ya na ndị otu ya sitere China bịara kpọtụrụ aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa. O mere ka a mara na mbà ahụ ebinyela aka n’akwụkwọ iwu bànyere iwunye ihe mwunye na mba òfèsi, ma kwuo na ebumnobi o jiri bịa bụ iji wee chọọ ụzọ ha ga-esi wunyekwuo ihe mwunye n’ọtụtụ ohere ọma ahụ jupùtara na ya bụ steeti, ọ bụnadị ka o kwuru na o nwere ọtụtụ ihe jikọrọ ha na steeti Anambra. Ọ sị na e wezùga ihe gbasaara azụmahịa, na e nwèrè ihe ndị ọzọ ha chọrọ ka ha na steeti Anambra na-emekọ, ọ kachasị dịka o siri metụta omenala na ịkwàlite njem nlegharị anya. N’akụkụ nke ya, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ, onye nabàtara ha bụ ndị ọbịa kwuputara njìkere steeti ahụ ịga n’ihu na ya bụ njikọaka n

Mba China ga-alụnye ụlọ ọlụ ukwu n'Onitsha

Izunna Okafor ỤLỌ ọrụ mba China, bụ ‘Oriental Golden Promise’ egosipụtala mmasị ha iwunye ụlọ ọrụ ukwu n’Ọnịtsha nke steeti Anambra. Ụlọ ọrụ ahụ, bụ nke jikọrọ aka ọnụ ya na ụlọ ọrụ ‘China Communication Construction Company’ na ụlọ ọrụ ‘Inland Water Ways Authority’ gosipụtara ma kwupụta mmasị a n’ọbịbịa ha bịara izute ọchịchị steeti ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti dị n’Awka, bụ ebe aka na-achị steeti ahụ nọrọ wee nabata ha. N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ Golden Promise, bụ Maazị Bob Wang kọwara ihe dị iche iche ụlọ ọrụ ahụ na-eme, kwuo na ha nwekwara ụzọ awara a pụrụ isite na ya buru ngwa ahịa si mba China bata Lagos n’ụgbọ mmiri, ma sịkwa na ha chọrọ ka steeti Anambra sorokwa rite uru n’ihe dị iche iche ụlọ ọrụ ahụ na-eme, bụzị nke mere ha jiri si mbà China chọrọ steeti ahụ bịa. N’okwu dịkwa ka ibè ya, osote onyeisi ụlọ ọrụ ahụ, bụ Maazị Sisley Yang mere ka a mara na ha bụ ọkàibe n’akụrụngwa mmepe obodo, ma kwuo na ha bịara ka ha gbanyekwa ngbọrọgwụ n’Ọnịtsha iji wee s