China achọọla nkwàlite mmekọrịta ya na Anambra
GỌỌMENTI mba China ekwuputala ma gosipụta njikere ya ịkwalite ezi mmekọrịta ahụ dị n’etiti ya na steeti Anambra n’ihe gbasaara nkwàlite mmepe obodo, na azụmahịa. Onye nnọchite anya mba ahụ n’ala Nigeria, bụ Maazị Zou Pingjian kwupùtara njikere a oge ya na ndị otu ya sitere China bịara kpọtụrụ aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa. O mere ka a mara na mbà ahụ ebinyela aka n’akwụkwọ iwu bànyere iwunye ihe mwunye na mba òfèsi, ma kwuo na ebumnobi o jiri bịa bụ iji wee chọọ ụzọ ha ga-esi wunyekwuo ihe mwunye n’ọtụtụ ohere ọma ahụ jupùtara na ya bụ steeti, ọ bụnadị ka o kwuru na o nwere ọtụtụ ihe jikọrọ ha na steeti Anambra. Ọ sị na e wezùga ihe gbasaara azụmahịa, na e nwèrè ihe ndị ọzọ ha chọrọ ka ha na steeti Anambra na-emekọ, ọ kachasị dịka o siri metụta omenala na ịkwàlite njem nlegharị anya. N’akụkụ nke ya, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ, onye nabàtara ha bụ ndị ọbịa kwuputara njìkere steeti ahụ ịga n’ihu na ya bụ njikọaka n