Posts

Showing posts with the label Mbọsị

A ga-etecha ụzọ Isekke-Mbọsị-Azịa-Ụkpọr tupu udú Mmiri – Obianọ

GỌỌMEENTI steeti Anambra emeela ka a mara na ya ga-etecha okporo ụzọ ahụ siri Isekke gaa Mbọsị gaa Azịa wee pụta Ụkpọr tupuu oge udu mmiri eruo n’ahọ a. Gọvanọ Willie Obianọ, bụ aka na-achị steeti ahụ mere ka a mara nke a oge ọ gara ịmara ka ọrụ si aga na ya bụ okporo ụzọ, bụ nke o sikwara na ya wee ga gbapee mmiri a gbapùrù site n’aka Maazị Paschal Agbọdike, bụ onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Ihiala nke abụọ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ. O kọwara ya bụ ụzọ dịka nke ga-eweta mmepe ma mekwa ka ihe dịrị ndị bi na mpaghara ahụ mfe ma ọ bụrụ na a rụchaa ya. Ọ kpọkùzịkwara ndị mpaghara ahụ ka ha gaa n’ihu ịkwàdò otu ndọrọ ndọrọ APGA, iji wee gaa n’ihu n’ọrụ ọma dị ihe iche na-ewere ọnọdụ ugbu a. N’okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr kwuru na a na-etinye uchu nke ukwuu na ya bụ ọrụ na ọrụ ngo ndị ọzọ e ji n’aka ugbu a, ma kwuo na a ga arụchapụ ya bụ ọrụ n’oge a tụrụ anya ya. Onye ji ya bụ ọrụ ngo, bụ Maazị Philip Eyisi, n’okwu nke ya, me