Ịrụ okporoụzọ ka na-aga n'ihu n'Anambra – Ifejiofor
KỌMISHỌNA na-ahụ maka ọrụ na steeti Anambra, bụ Maazị MarcelIfejiọfọr emeela ka a mara na a ga-arụchapụ ọrụ okporo ụzọ Achina-Onneh-Ogbojin’ime oge ọkọchị na-abịa abịa. Kọmishọna Ifejiọfọrkwupụtara nke a oge ya na ndị nta akụkọ na-akparịta ụka na mmemme a kpọrọ‘Media Target’, bụ nke weere ọnọdụ n’Awka, ma bụrụkwa nke ọ nọrọ na ya wee kọwaaka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe dị iche iche e ji ọrụ okporo ụzọ n’aka nasteeti ahụ. Dịka o siri kọwaa, aga-arụchapụ ụzọ ahụ b’ime ọkọchị n’ihi na e nyecha ihe e kwesiri inye iji rụchapụya bụ ụzọ, kama na ọ bụ mmiri na-agbaghachi aka elekere azụ. N’ihe gbasaara ụzọ‘Amansea-Ebenebe-Awba-Ofemmili’, Maazị Ifejiọfọr mere ka a mara na a rụchaala ọrụe kwesiri ịrụ n’ala ebe ahụ tupu a malite ite ya, ma kọwaa na ọ bụ naanị ite yabụ okporo ụzọ ete bụ ihe fọzịrị ugbua. Ọ gara n’ihu kọwaana a gaara etechago ya bụ ụzọ, kama na ihe banyere korona na mmechi ahụ emechisịrị ebe niile gbachighara aka elekere azụ, ọbụnadị dịka o nyere owuweanyana a ga-arụchapụ