Gọọmenti Anambra atụbatala akị oyibo e siri mba Malaysia bulata
EGWURU ma akọchighị bù ụkọ nri, maka na ọ bụ onye gwuru kọchie na-egwute ọzọ echi. Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti Anambra ebutela ógbè akị oyibo ruru puku iri abụọ (20,000), bụ nke a ga-akụ akụ na steeti ahụ. Akị oyibo ahụ bụ nke e siri mba Malaysia wee bute, ma bụrụkwa nke e buru gaa kpọnkwem n’isi ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ugbo, bụ ‘Ministry of Agriculture’ na steeti ahụ, site n’aka òtù ahụ jikọtara ndị na-azụpụta, na-ahazi, ma na-erekwa akụ oyibo n’ala Nigeria, bụ ‘National Coconut Producers, Processors and Marketers Association of Nigeria (NACOPPMAN)’. N’okwu ya oge ọ na-anabata akị oyibo ahụ n’aha gọọmenti steeti Anambra, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti ahụ, bụ Dọkịta Foster Ihejiofor kwùrù na ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo na-agbasi mbọ ike ma dịkwa ezi njikere ịhụ na e nwere nri gbàànyụụ na steeti ahụ. O kwupụtakwara mkpebi ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nwere ime ka ọnọdụ akụnụba steeti ahụ na ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ kwụrụ chịm ma bụrụkwa ejiamaatụ; ma mekw