Òtù MUNA edebànyerela mmadụ iri ise aha isonye n'atụmatụ ahụ ike ASHIA
ÒTÙ nnọrọonwe a maara dịka MUNA Foundation’ n’aha bekeeakwàdola ndebànye aha ndị mmadụ ruru iri ise n’ọnụọgụgụ n’akwụkwọ atụmatụnchekwa ahụ ike ‘Anambra State Health Insurance Agency’ bụ ‘ASHIA’, ka ha weeso rita urù n’atụmatụ nchekwa ahụ ike ahụ. Mmadụ iri ise ndị ahụe debànyere aha ha n’akwụkwọ atụmatụ nchekwa ahụ ike bụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyịobodo Ịgbakwụ dị n’okpuru ọchịchị Ayamelụm n’me steeti Anambra. Mmemme idebanyeaha ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Ịgbakwụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị mmadụ sonyere naya, ọkachasị ndị nne na na nna. N’okwu ya banyerenke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ASHIA, bụ Dọkịta Simeon kọwara atụmatụ ahụ ike ahụ dịkanke magburu onwe ya, ma bụrụkwa nke mịtagoro ọtụtụ mkpụrụ ọma dị iche ichen’ihe metụtara ịkwalite ezi ọọdụ akụ ike ụmụafọ steeti ahụ. O kelekwara makwupùru òtù MUNA ahụ maka ịghọta mkpa ọ dị idebanyere ndị ahụ aha n’akwụkwọ kaha wee soro rita urù n’atụmatụ ahụ, ọbụnadị dịka o jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuoma dụọ ndị maọbụ òtù dị iche iche bụ ndị aka ji akụ ma