Obianọ anabatala ugwu akwanyere Anambra maka ịkwàlite MSME
AKA na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ anabàtala nkwanye ùgwùṅahụ e nyèrè steeti Anambra na nso-nso a dịka steeti kacha akwàdo obere ụlọ ọrụ na azụmahịa ka na-eto eto n’ala Nigeria, a maara na bekee dịka ‘Micro, Small and Medium Scale Enterprises’, bụkwa nke e nyere site n’aka osote onyeisi ala, bụ maazị Yemi Osinbajọ n’aha gọọmenti etiti. Inyefè ya nkwanye ùgwù ahụ bụ nke e mere na nzukọ isi ọchịchị obodo ahụ nwere nso-nso a n’obi gọọmenti dị n’Awka, ma bụrụkwa nke e mere site n’aka odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ. N’okwu ya oge ọ na-anbata ya bụ nkwanye ùgwù, gọvanọ Obianọ kọwara n’eziokwu na steeti ahụ na-eme nke ọma na ngalaba ahụ, tinyere ngalaba ọrụ ugbo, ngalaba mmepụta ngwọahịa, ngalaba ọrụ na ngalaba ndị ọzọ dị iche-iche. Ọ gakwazịrị n’ihu kwe nkwa na ọchịchị ya ga-agawanye n’ihu n’ịkwàdò ngalaba ndị ahụ na ụmụafọ steeti ahụ chọrọ ibido obere azụmahịa, ọ kachasị dịka o siri metụta n’inweta ego ha ga-eji mee nke ahụ site n’isi ụlọ a