Ndị Igbo bi London emeela ngagharịiwe maka ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo
ỤFỌDỤ ndị Nigeria bi London, United Kingdom, emeela ngagharịiwe na nsonso a iji katọọ ogbugbu a na-egbu ndị ndị mmadụ, tinyere ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị na South East ala anyị. Ngagharịiwe ahụ ka e kwuru na ha mere ya ụbọchị onyeisiala Muhammadu Buhari kwesịrị ịga njem nleta ahụike na London. Ma onyeisiala mechaara yigharịa njem ahụ. Dịka e siri kwu, ndị ahụ mere ngagharịiwe malitere site n’ebe a kpọrọ Trafalgar Square wee ruo n’ụlọ Nigeria (Nigerian House) dị na London iji debanye (register) nwute he banyere ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị na mpaghara South East. E gosipụtara ndị ahụ mere ngagharịiwe n’onyoonyoo ka ha yi ejiji njirimara ndị Igbo na-agụ egwu: “Kwụsị igbu ndị Igbo. Ndị Igbo nwekwara nne.” Ha gara n’ihu kwuo na ndị ọrụ nchekwa nọ na mpaghara South East na-egbu ndị ntorobịa ha, na-emegide nne n a nna ha, na-ama ndị nne ha elu n’ike ma na-atọrị ha. Ha kwuru ka ndị ọrụ nchekwa gaa na mgbago (North), ga zọpụta ụmụaka a na-atọrị.