Nwaanyị Nigeria a kpọbara ka ahịa na mba Lebanon ajụla ịlọta ka a zọpụtachara ya
Ọ ONYEISIOCHE otu na-ahụ maka ndị ala anyị nọ mba ọzọNigerian Diaspora Commission (NIDCOM) bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuputala na otunwaanyị onye Nigeria aha ya bụ Peace Busari onye nke a chọrọ irefu dịka a kpọbaraya ka ahịa na mba Lebanon ajụla ịlọghachị ala Nigeria. Onyeisioche NIDCOMonye kwuru nke a n’izuụka gara aga dịka ya na Ambasadọ mba Lebanon na Nigeria bụHoussan Diab na-akparịta, kọwara na nwaanyị ahụ anabataghị oku niile a na-akpọya ka ọ lọghachi Nigeria. Dabiri kwuru naBusari onye nke gbara afọ iri atọ na atọ kwuru na ya enwetala ọrụ ọzọ nke merena ya chọziri ịnọ na mba Lebanon. Ọbụladi arịọrịọ gọọmentisteeti Oyo rịọrọ ya e meghị ka ọ gbanwee obi ya n’ihi na ọ nọ na-ekwu na okpebiela ịnọ mba ahụ. Dabiri-Erewa kwuru sị;“Ọ bụrụ maka nwaanyị Nigeria ahụ onye nke anyị gbara mbọ zọpụta, onye nke amara ọkwa (advert) ire ya n’ọnụ ego $1000, Ambasadọ ahụ gwara anyị na onyekpara arụ ahụ bi na mba Lebanon. Nke bụ eziokwu bụ na o kwuru na ya achọghị ịlọchighaNigeria, dịka ọ kọwar