Onye ka ọ dịịrị igbapụta Nwada Leah Shuaibu?
LEAH Shuaibu bụ otu nwata akwụkwọ nke ka nọ n’aka ndị ọlụọ ọ laa, ‘Boko Haram’ bụ onye nke atọhapụgoro ụmụakwụkwọ ndị otu ya akpọọla oku site n’onyonyoo, ka a gbapụta ya. Nwatakịrị nwanyị a bụ onye nke a wakporo ma tọrọ ya na ụmụakwụkwọ dị otu nari na iri site na ‘Government Girls Science and Technical College (GGSTC)’ Dapchi, nke dị na Yobe. Ọ kpọrọ oku ka onye isi ala, Muhammadu Buhari na ndị Nigeria niile gbaa mbọ gbapụta ya. Nke a bụ ihe ịgba anya mmiri dịka nwatakịrị a na-akpọ oku ka a gbapụta ya ka o nwere onwe ya dịka otu nari na ise ndị ọzọ bụ ndị nke otu ‘Boko Haram’ kpọchighara Dapchi n’ọnwa Maach afọ a, ka ha jichara ha abalị iri atọ. Otu ‘Boko Haram’ jụrụ ihapụ Nwada Sharibu ka ọ laa n’ihi na o kweghi ịhapụ okwukwe ya n’ime Kraist. Ka ihe siri gbata kwụrụ, o kwesịrị ka a gbaa mbọ hụ na nwatakịrị ahụ si n’aka otu ọjọọ ahụ pụta. Ndị otu Kraist kwesiri ịba n’ekpere n’isi nwata a ka Chineke buoro ya agha. Ndị ọnụ ruru n’okwu n’ala Nigeria kwesịkwara ileba anya wee chọpụta ihe