A sị na Leah Shaibu amụọla nwa n'aka ndị Boko Haram
NWATA akwụkwọ nwaanyị ahụ bụ Leah Sharibu nke ndị agha ọ lụọọ laa Boko Haram tọọrọ n’ụlọakwụkwọ ka e kwuru na ọ mụọla nwa nwoke n’ebe ahụha ji ya. Ka anyị cheta na ka ọnwaFebụari afọ 2018 dị n’abalị iri na iteghete ka o ji ọkara gaa elekere ise nkemgbede ka a wakporo ụmụakwụkwọ na Government Girl’s Science and TechnicalCollege (GGSTC) Daptchi, nke dị na Bulabulin n’okpuru ọchịchị Yunusari, steetiYobe. Ha tọọrọ ụmụakwụkwọdị otu nari na iri n’ọnụọgụ; ndị nọ n’agbata afọ iri na otu wee ruo iri naiteghete. Ha mechara hapụ ụmụakandị ọzọ ma jidezie sọọsọ Leah bụ onye dị afọ iri na anọ mgbe ihe ahụ mere. Ha jụrụ ịtọhapụ Leahonye okpukperechi ụka Christ (Christian) n’ihi na ọ jụrụ inabata ụka alakụba(Islam). E kwuru na onye kọmandaBoko Haram ebighi n’ala Nigeria kpọọrọ ya lụba ya ka nwunye. Onye wetere ozi ahụkwuru na ọ bụ na Satọdee ka Leah mụrụ nwa ahụ na Niger Republic. N’okwu ọ gwara ndịnta akụkọ n’ekwenti, nna Leah bụ Maazị Nathan Sharibu kwuru na ya agaghị atụpụ ọnụn’akụkọ